ENWERE M OLILEANYA NA CHINEKE - Family Radio Worldwide
ENWERE M OLILEANYA NA CHINEKE - Family Radio Worldwide
ENWERE M OLILEANYA NA CHINEKE - Family Radio Worldwide
You also want an ePaper? Increase the reach of your titles
YUMPU automatically turns print PDFs into web optimized ePapers that Google loves.
ENWERE M

OLILEANYA

NA CHINEKE

GA-AZOPUTA M

Nke Harold Camping Dere

i
Enwere m Olileanya Na Chineke Ga-azọpụta m

(I Hope God Will Save Me – Igbo)

Nke Harold Camping dere

Ndị Kwadebere ma bipụta ya bụ;

Family Stations, Inc.

Oakland, California 94621

www.familyradio.com

( kwa : Amaokwu nile nke Akwụkwọ Nsọ e hotara n’ime akwụkwọ a

sitere na Baịbụl

nke Union Igbo.)

Mbipụta Nke Mbụ Eprel 2007

Mbipụta Nke Abụọ Maach 2008

Mbipụta Nke Atọ Eprel 2009

08-28-2012

ii
IHE DI NA YA

Okwu mbido ............................................................................................... v

Enwere m olileanya na Chineke ga-azoputa m ....................................... 1

Gini Ka Chineke Nweburu Ime iji zoputa Mmadu? ............................... 3

Ndi Chineke Hotara .................................................................................... 4

E Were Ndi A Hotara Nye Kraist .............................................................. 5

Onye Ahu Buru Nmehie ............................................................................. 6

Oke Igwe Ndi Mmadu A na-akabeghi Zoputa bu Ndi

Chineke Na-apughi Ibibi ............................................................................ 7

Mmadu Nile Nwuru Anwu n’ime Mmuo site n’afo Nne ha ................. 9

A Ghaghi Inye Anyi Nkpuru obi Ohuru ................................................ 10

Ihe Nzoputa Nke Ndi A hoputara Bu n’ezie ......................................... 12

Oru ebube nke di N’ Omumu Ohuru ahu ............................................. 13

Oru nke Ime Mmuo Dika Baibul si akowa Ya ....................................... 14

Kraist Ruru Oru Nile A choro maka Nzoputa Anyi ............................. 16

Gini Meziri Chineke Ji Enye Anyi Iwu Ndi a? ...................................... 16

Di Omimi nke di n’etiti Chineke na Mmadu ......................................... 17

Chineke Na-anwale Mmadu .................................................................... 20

Oke mkpa Izu ike nke Ubochi nke Asaa Di ........................................... 20

Ngozi nile nke Di N’atumatu Nwale Chineke ...................................... 22

Chineke na-eme ka Atumatu Nwale Ya Rawanye ahu ........................ 23

Anyi apuru Inu Ihe Baibul na-ekwu mana ghara Inu Ya? ................. 26

Jiri Otu Akuku Akwukwo nso tulekota Ya na

Akuku ozo n’Akwukwo Nso .................................................................. 27

A na-enye Mmadu Nile Iwu ka Ha Kpokuo Chineke ......................... 29

Oru Nke Ikwere ........................................................................................ 31

A na-enye Mmadu Nile Iwu ka ha Kwere Chineke ............................ 33

Kraist Ruru Oru Nile- Kwudosiri ike n’Okwukwe-iji

Zoputa Anyi .............................................................................................. 34

Oru Nke Ikachite Ihe Akara Bu Oru Nke Chineke Mgbe Nile .......... 35

Oge Ufodu, A ghaghi Idezighari Ntughari Asusu Ahu ..................... 36

iii
Abraham O Kweere Chineke a we Zoputa ya n’ihi nke a? ................ 39

Anyi kwere Kraist, O puru Izoputa Anyi ............................................. 40

Mgbaghoju anya di N’ighota Okwu a bu“Kwere” .............................. 43

Ekwensu Na-abia Dika Muo Ozi nke Ihe ............................................. 44

A Kaara Imebu ka Nzuko Uka nile digide Ocha? ............................... 46

Mgbanwe Di Uku ..................................................................................... 48

Onye A zoputara Na-ebi Ndu n’ime Ahu a na-azoputaghi ............... 49

Ochicho obi nke Onye ahu A zoputara ................................................. 50

Egwu na Ima Jijiji ...................................................................................... 51

Mana Ihunanya zuru oke Na-achupu Egwu ........................................ 54

Olileanya O dikwara M? .......................................................................... 56

Indeks nke Akwukwo Nso .................................................................... 64

iv
OKWU MBIDO

Otutu ndi mmadu na-asi, “achoro m ka a zoputa m.” Ya

mere, n’ime ntakiri akwukwo a, anyi ga-agbali iji eziokwu zuru oke,

we leba anya n’ajuju a: Olee ihe m na-aghagi ime iji buru onye a

zoputara? N’ihi na anyi ga-amuta na o nweghi onye o bula puru ime

ihe o bula iji buru onye a zoputara, nke a nwere ike ime ka obi daa

otutu ndi na-agu akwukwo mba bu ndi ga-ekpebi na olileanya

adighizi nakwa na o nweghi onye o bula a ga-azoputa. Mana nke bu

eziokwu bu na, ihe gbasara ndi mmadu iburu ndi a zoputara

n’ubochi anyi a abughi nke olileanya na-adighi. N’eziokwu, dika anyi

na-elezi anya nke oma na-amu Baibul anyi na-achoputa na ihe akaebe

nke Baibul na-egosi anyi na e nwere oke owuwe ihe ubi nke ndi

mmadu iburu ndi a zoputara n’oge a n’uwa.

Ihe akaebe nke Baibul bu na n’ubochi anyi a, ndi mmadu hiri

nne ka a na-azoputa karia ndi a zoputabugoro n’oge o bula ozo

kemgbe uwa dibara. Mana a naghi azoputa ha site na ha igbaso

atumatu nzoputa nke uka o bula ma o bu onye nkwusa ozioma o

bula bu onye kwenyere n’atumatu nzoputa nke nzuko ya. Anyi gaamuta

na o di oke mkpa na ndi ahu na-akuzi atumatu nzoputa nke

Chineke ga-eme nke a site n’ikwudosi ike n’atumatu nzoputa nke

Chineke guzobere dika e siri detuo ya n’ime Baibul.

v
Enwere m Olileanya Na

Chineke Ga-azoputa m

Chineke kere uwa n’ihe dika afo 13,000 gara aga. N’oge

ahu, malite na ndi mbu muru anyi, bu Adam na Iv, O kere mmadu

n’oyiyi Ya nakwa n’onyinyo Ya. Mana mmadu nupuru isi megide

Chineke, iji nye ha ntaramahuhu, oke iwe nke Chineke dakwasiri

mmadu nile. Nnupu isi nke a di oke njo nke na dika iwu nke Chineke

si mebe ya, o bughi nani na mmadu etufuola ohere ya onwe ya na

Chineke ino ruo mgbe ebighi ebi kama a ga-ebibikwa ya ruo mgbe

ebighi ebi site n’ikpochapu ya kpamkpam n’ubochi ikpeazu nke

odidi uwa a. Ya mere, otutu ndi mmadu na-akwa akwa si, achoro m

nnoo ibu onye a zoputara puo n’omuma ikpe nke mbibi ebighi ebi.”

Mmadu o bula di ndu maara na e nwere Chineke bu onye naagukoro

ya nmehie ya nile. Nke a bu n’ihi na e kere mmadu n’oyiyi

nakwa onyinyo nke Chineke. Obuna n’agbanyeghi na nkewa adila

n’etiti ya na Chineke n’ihi nnupu isi ya megide Chineke, ma n’ime

uche ya o maara Chineke ma marakwa na Chineke na-agukoro ya ihe

nile o na-eme. Anyi na-aguta na Ndi Rom 2:13 ruo 15, n’ime

amaokwu ndi a okwu a bu “Ndi mba ozo” na-arutu aka na ndi

mmadu nile nke uwa bu ndi na-amaghi ihe o bula gbasara Baibul:

N’ihi na o bughi ndi na-anu iwu bu ndi ezi omume n’ebe Chineke

no, kama o bu ndi na-edebe iwu ka a ga-agu na ndi ezi omume:

n’ihi na mgbe o bula ndi mba ozo ndi na-enweghi iwu na-eme ihe

nile di n’iwu site ka e si mu ha, ndi ahu, o bu ezie na ha enweghi

iwu, ma ha onwe ha bu iwu e nyere onwe ha; n’ihi na ha na-egosi

olu iwu na e dewo ya n’obi ha, ako na uche ha na-esokwa ya naagba

ama, ihe ha na-atule n’obi ha n’etiti onwe ha na-ebokwa ha

ebubo ma o bu eleghi anya na-agopu ha;

N’ihi nke a, mmadu nile, maara n’ime mmuo ha na o bu

nmehie; ya bu, ime njehie n’iwu nke Chineke, bu igbu ochu, izu ohi,

ikwa iko, w.d.g. O makwara n’ime mmuo ya na Chineke mebere

ntaramahuhu maka nmehie nile nke onye ahu. Ya mere, mmadu o

bula di ndu na-agbali ichota uzo isi me ka ya na Chineke di n’udo. Ya

1
u, o na-agu ya agu ichota uzo o ga-esi gbanahu ntaramahuhu

jogburu onwe ya maka nmehie nile ya.

Ufodu na-agbali igbo nsogbu a joro oke njo site n’igwa onwe

ha na o nweghi Chineke o bula di ha ga-aza ajuju. N’ihi nke a ha naagbalisi

ike ibu ndi na-ekwenyeghi na Chineke di ma o bu ndi naekwu

na mmadu malitere site n’anu ohia ma o bu ndi na-ekwu na o

nweghi onye puru ima ma Chineke o di.

Ndi ozo emebela chi ndi nke ha na-efe. Ha na-emebe chi nke

osisi ma o bu nkume, dika ndi na-efe Buddha, ma o bu, dika ndi naagu

ihe di na kpakpando, ha na-elegara kpakpando anya dika chi ha,

ma o bu dika otutu ndi mmadu, ha na-achota otu okpukpere chi nke

obi ha nabatara. Usoro okpukpere chi ahu nwekwara ike o nweghi

ihe ga-ejiko ya na Baibul ma oli ma o bu o nwere ike jiri ufodu

amaokwu ndi di na Baibul iji kwado ya. Ya mere, ha na-achota usoro

okpukpere chi nke ha kwenyere na o bu ya kacha nma iji me ka ha na

Chineke di na udo.

Nke bu eziokwu bu na taa ihe dika otu uzo n’ime uzo ato nke

onu ogugu ndi mmadu nke uwa na-akpo onwe ha “Ndi nke Kraist.”

Nke a putara na ha so n’otu okpukpere chi nke na-eji ufodu akuku

nke Baibul iji kwado okwu onu ha na nke ahu bu Ozioma nke gaadotara

Chineke ndi mmadu. Otu okpukpere chi nile n’otu n’otu, ma

o nwere nani ntakiri ihe jikoro ya na Baibul, ma o bukwanu na o

dichasi nnoo ka o kwudosiri ike na Baibul, na-ekwuputa na ha nwere

uzo kachasi buru nke ezie mmadu na Chineke idi n’udo. Nke a bu

ihe a ga-ahu n’ime ekpemkepe ndi a ma ama nke oma dika ndi uka

Roman Katolik, ndi uka Baptist, ndi uka Rifom, ndi Presbiterian, ndi

Adventist, ndi ama Jihova, ndi Momon, w.d.g. Ma o di nwute na, o

nweghi nke o bula n’ime ekpemekpe ndi a nwere nghota zuru ezu

n’ihe gbasara ihe a choro iji me ka mmadu na Chineke di n’udo, ya

bu, iji buru onye a zoputara puo n’oke iwe nke Chineke, nke bu

ntaramahuhu maka nmehie ha.

Ma o di nwute na, ndi ahu tinyegoro ntukwasi obi ha maka

inwete nzoputa ha n’otu ekpemekpe o bula n’ime ndi a ka no n’ime nsogbu

miri emi nke Chineke n’ihi na otu ekpemekpe ha apughi izoputa ha.

Ma o di nwute na, ndi ahu tinyegoro ntukwasi obi ha maka

inwete nzoputa n’otu ekpemekpe o bula n’ime ndi a ka no n’ime

nsogbu miri emi nke Chineke n’ihi na otu ekpemekpe ha apughi

izoputa ha, ha anaghikwa ege nti nke oma n’otu isi iyi nke eziokwu e

nwere nani ya, bu Baibul.

2
N’ime akwukwo a, anyi ga-agbali iweputa ya kpomkwem,

otu ga-ekwe omume, bu nkuzi nke Baibul gbasara atumatu Chineke

nke bu n’ime ya ka otutu ndi mmadu ga-esi buruzi ndi ha na

Chineke ga-adizi n’udo ma gbanahu ikpe joro oke njo nke gaadakwasi

agburu mmadu n’oge nke isi njedebe uwa.

Anyi aghaghi icheta na Baibul, dika o di n’asusu ndi mbu

mbu ya, na o bu Chineke dere ya, mana Chineke jiri ndi ode

akwukwo bucha mmadu de ya, dika II Pita 1:21, na-agwa anyi:

N’ihi na o dighi amuma o bula nke e ji ochicho mmadu bu mgbe o

bula: kama mmadu sitere na Chineke kwu okwu, mgbe Muo Nso

na-eme ka ha kwue.

Nkpuru okwu ndi nke ha deturu bu Chineke n’onwe Ya

kwuputara ha (Jeremaia 36:1 ruo 4). Ya mere, site n’igu ma na-amu

Baibul anyi na-enwete isi iyi nke eziokwu bu ya kachasi di uku ma

buru nke ikpeazu. Ya mere, nghota o bula n’otu n’otu mmadu nwere

n’ihe gbasara atumatu nzoputa nke Chineke aghaghi idabako

kpomkwem na nkuzi nke Baibul. Ya mere, anyi ga-adiriri njikere

inyochasi nkuzi nile nke mmadu weputara site n’itulekota ya na

amaokwu o bula di na Baibul.

Gini Ka Chineke Nweburu Ime iji zoputa Mmadu?

Anyi ga-aga n’ihu n’omumu anyi a site n’ilezi anya nke oma

we choputa ihe ahu Baibul na-ekwuputa gbasara ihe ga-egbo nsogbu

nke onodu di oke njo nke chere mmadu ihu. Anyi ga-ahu na onodu

mmadu joro oke njo nke na nani Chineke n’onwe Ya puru iweputa

uzo izi gbanahu ya.

Anyi aghaghi icheta na Baibul n’ozuzu ya bu akwukwo iwu,

nke Chineke dere n’onwe Ya, nke mmadu nile no n’okpuru ya, n’otu

aka ahu, Chineke nokwa n’okpuru ya (Abu Oma 138:2). Ya mere ihe

ahu ga-egbo nsogbu a jogburu onwe ya diri mmadu bu nke gaenwezuriri

ihe nile ahu a choro n’iwu nke e weputara n’ime

akwukwo iwu nke Chineke, bu Baibul.

E nwere ihe ato di mkpa n’ebe o di ukwu nke Chineke naeme

n’onwe Ya nke a kachasi cho iji mee ka mmadu nwe ike nwete

nzoputa n’ime ndu ya. Ihe ato ndi a bu nke a choro n’ebe onye o bula

a zoputara no. O nweghi onye a gupuru.

3
Ndi Chineke Hotara

Oru nke mbu Chineke na-aruchitere ndi ahu nile a gaazoputa

bu na tutu e kee uwa, Chineke hoputara mmadu nile O gaazoputa.

Anyi na-aguta na Ndi Efesos 1:3 ruo 5:

Onye a goziri agozi ka O bu, bu Chineke na Nna nke Onyenwe

anyi Jisus Kraist, Onye were ngozi nile o bula nke Muo Nso gozie

anyi n’ebe di n’eluigwe n’ime Kraist: dika O roputara anyi n’ime

Ya mgbe a katoghi ntoala uwa, ka anyi we di nso burukwa ndi a

na-apughi ita uta n’ihu Ya n’ihunanya: ebe O buuru uzo ka anyi

aka ka e we site n’aka Jisus Kraist do anyi ka umu Ya ndikom, dika

o di Ya ezi nma n’ochicho Ya,

Ka Chineke na-akwadebe ike uwa nke a nakwa ijeri puru ijeri

ndi mmadu bi n’ime ya, O lere anya n’oge nile nke ga-di n’uwa ma

hu onu ogu ndi mmadu no na nhujuanya ndi na-enupu isi megide

Ya. N’agbanyeghi na Chineke kere mmadu ka ha buru ndi zuru oke,

n’oyiyi nakwa onyinyo nke Chineke, Baibul na-eme ka o doo anya na

Chineke maara na mmadu ga-enupu isi megide Chineke, nakwa na

nnupu isi ahu ga-ebutere agburu mmadu ibu ndi nwuru anwu n’ime

mmuo nakwa buru ndi oria nke nmehie juputara n’ime. Chineke

makwara na mmadu ga-emecha na-agbalisi ike ime ka ya na Chineke

dikwa n’udo site n’ichoghari Chineke n’ime atumatu di iche iche nke

uche mmadu meputara, bu nke oria nmehie juputara n’ime

kpamkpam, mana o nweghi onye ga na-acho Chineke site n’idabere

n’uzo ndi ahu nke Chineke choro.

Chineke makwara na mmadu ga-emecha na-agbalisi ike ime

ka ya na Chineke dikwa n’udo site n’ichoghari Chineke site n’ime

atumatu di iche iche nke uche mmadu meputara

Na Ndi Rom 3:10 ruo 12, Chineke na-akowa onodu

nhujuanya nke mmadu no n’ime ya. N’ebe ahu anyi na-aguta:

Dika e edworo ya n’akwukwo nso, si, O dighi onye bu onye ezi

omume, o dighi otu onye ma oli; O dighi onye na-aghota, O dighi

onye na-acho Chineke; Ha nile ewezugawo onwe ha, ha nile abaghi

n’ihe n’otu; O dighi onye na-eme ihe oma, o dighi obuna otu onye.

4
Ma, n’agbanyeghi na o jogburu onwe ya bu nnupu isi

mmadu megide Chineke , ma Chineke mere nkpebi di oke itunanya

na ruo mgbe ebighi ebi Ya na otutu n’ime ndi a na-enupu isi ga-ano.

Mana olee otu O puru isi kporo ndi a ka ha na Ya noro ruo mgbe

ebighi ebi? Ntaramahuhu maka nmehie ha buru oke ibu. Olee otu

Chineke puru isi kporo ndi a ka ha na Ya noro ruo ebighi ebi, bu ndi

o bu na n’ihi nmehie ha, iwu kwuru na a ghaghi ibibicha ha?

Ntaramahuhu nke diri nmehie jogburu onwe ya n’ebe o di ukwu

n’ihi na nmehie nke agburu mmadu jogburu onwe ya n’ebe o di

ukwu. Nke a bu ihe di oke itunanya gbasara atumatu nzoputa nke

Chineke zubere maka agburu mmadu.

Ya mere, site na tutu oge ito ntoala nke uwa, Chineke abughi

nani na O hoputara ndi ahu O choro ido nso nyere onwe Ya (Ndi

Efesos 1:4), kama O kwukwara ugwo maka nmehie nile ha. Ochicho

obi Ya enweghidi ihe o bula jikoro ya na ihe mmadu na-eme ma o bu

ihe mmadu na-acho. Chineke na-ekpwuputa na Ndi Rom 9:15:

...M ga-emere onye o bula ebere, bu onye M na-emere ebere, M gaenwekwa

obi ebere n’ahu onye o bula, bu onye M ga-enwe obi

ebere n’ahu ya.

Site n’ime ka anyi mara maka oru mbu a nke Chineke di

mkpa n’ebe o di ukwu, Chineke na-enye ndi nile a na-azoputaghi

olileanya di ukwu. Chineke na-ekwusi ike na Ya abughi onye na-ele

mmadu anya n’ihu (Ndi Rom 2:11, Ndi Efesos 6:9, Ndi Kolosi 3:25). O

nweghi mba o bula ma o bu otu ndi mmadu a ga-agunye na ndi

Chineke hoputara karia otu ndi ozo. O nweghi otu ndi nmehie a gaasi

na o ga-ara nnukwu ahu ha onwe ha ibu ndi a zoputara karia otu

ndi ozo.

Baibul dere banyere nzoputa nke nwanyi ahu na-akwa iko na

Jon 8, o dekwara banyere nzoputa nke onye ekperima ahu a

kpogidere ya na Jisos n’obe na Luk 23:9 ruo 43. Ya mere,

n’agbanyeghi udi uku nmehie anyi nwere ike idi, o buru na anyi nwe

agu miri emi inwe nzoputa site n’idabere n’otu Chineke si cho ya, o

bu ihe puru ime eme n’ezie na anyi ga-eso n’ime ndi Chineke

hoputara. Ebe o bu na taa a na-azoputa oke igwe ndi mmadu, o puru

ime eme n’ezie na, mu onwe m, kwa, ga-abu otu n’ime ha. Nke ahu

bukwa oke ihe agbamume.

E Weere Ndi A Hotara Nye Kraist

Ndi ahu Chineke hoputara ka a gbaputa ha ma o bu zoputa

ha bu ndi e weere nye Onyenwe anyi Jisos Kraist, dika anyi na-aguta

na Jon 6:37:

5
Ihe nile nke Nna M na-enye M ga-abiakute M; onye naabiakutekwam

M gaghi achupu ya ma oli.

Mana, n’ihi ka Jisos we were ndi a a hotara dika ihe

onwunwe nke Ya ruo mgbe ebighi ebi, o nwere otu ihe e kwesiri ime

banyere nmehie nile ha. Iwu zuru oke nke Chineke, bu nke Chineke

dere n’onwe Ya, na-ekwu na n’ihi na e kere mmadu n’onyinyo nke

Chineke, na mmadu nile aghaghi ikwu ugwo nke iwu Chineke choro

maka nmehie nile ha. Ya mere, n’agbanyeghi na ha bu ndi Chineke

hoputara ma were ha nye Kraist ka ha buru ihe onwunwe Ya ruo

mgbe ebighi ebi, ma Kraist agaghi enwere ha bere nani ma a kwuo

ugwo maka nmmehie ha. Iwu nke Chineke na-ekwu na ugwo a gaakwu

maka nmehie bu onwu, ya mere ihe o putara bu na, ndi ahu a

hotara ma were ha nye Kraist agaghi enwe ike iburu ndi Kraist nwe

n’ihi na ha enweghi ike ikwu ugwo ahu. Nke a na-edubatazi anyi

n’oru ozo di oke itunanya nke Chineke ruru n’aha ndi ahu nile a naazoputa.

Onye Ahu Buru Nmehie

Mgbe Chineke lere anya na mbara uwa, bu nke O zubere ike

n’isi mbido nke oge, O huru na o nweghi onye o bula O puru iji ka

onye ahu nagide onuma nke Chineke n’onodu ndi ahu a hoputara,

ndi ahu Chineke hotara bu ndi ahu e weere nye Kraist ka ha buru ihe

onwunwe Ya ruo mgbe ebighi ebi. A kuziri nke a n’Aisaia 63:5

nakwa Ezikiel 22:30. Mana, iwu zuru oke nke Chineke na-ekwu na

ugwo nke bu onwu bu nke a na-aghaghi ikwu tutu enye onye o bula

ohere ibata n’ime Eluigwe di nso nke Chineke. Akuku o bula nke iwu

Chineke zuru oke bu nke a ga-emezu n’uzo zuru oke.

Ya mere, n’oru nke ebere nakwa ihunanya nke na-enweghi oyiri,

Kraist n’onwe Ya buuru onye ahu bu nmehie n’onodu ndi ahu

nile e weere nye Ya.

Ya mere, n’oru nke ebere nakwa ihunanya nke na-enweghi

oyiri, Kraist n’onwe Ya buuru onye ahu bu nmehie n’onodu ndi ahu

nile e weere nye Ya. Anyi na-aguta n’Aisaia 53:6:

Anyi nile kpafuru akpafu dika igwe aturu: anyi chere ihu, onye o

bula n’uzo nke aka ya: ma Jehova emewo ka ajo omume nke anyi

nile dakwasi ya.

6
Okwu a bu “nile” di n’ime amaokwu a na-ekwu maka ndi

nile a hoputara, ya bu, ndi nile ahu Chineke hotara tutu a too ntoala

uwa ka ha buru ndi a ga-azoputa. N’ezie O kwuru ugwo maka

nmehie nile ha tutu O kee uwa. N’ime ihe onyonyo di iche iche (ilu

ndi nwere akuku ato na-ako akuko ihe mebugoro n’uwa) Kraist

gosiputara ka uwa hu otu O siri taa ahuhu n’ikwu ugwo maka

nmehie nke ndi a hoputara. Nke a ka a ga-ahu o kachasi na ngosiputa

nke ahuhu O tara mgbe a kpogidere Ya n’obe. Dika ima atu, e kobere

Ya n’obe n’uzo na-eme oke ihere iji gosiputa na mgbe O kwuburu

ugwo maka nmehie anyi na O buuru abum onu. “Onye a buru onu

ka o bu bu onye a na-akwuba n’elu osisi.” Mgbe e tinyere ahu Ya

n’ime ili, nakwa mgbe O bilitere n’ututu ubochi uka, nke ahu bu

igosiputa na mgbe ahu O kwuru ugwo nmehie anyi n’ezie tutu a too

ntoala uwa na n’ezie O nwuru n’odidi ahu Ya zuru ezu, ahu na

nkpuru obi, ma bilitekwa ozo

iji gosi na ugwo maka nmehie anyi ezuola oke kpamkpam.

Mgbe Kraist mebere onodu maka nzoputa nke ndi a

hoputara, nmehie nile n’otu n’otu nke onye o bula n’otu n’otu O

mere atumatu izoputa bu nke e bokwasiri Ya. Mgbe ahu, O buru ibu

aro nke a di ukwu bu nmehie, guzo inara ikpe n’ihu Chineke, bu

Onye ikpe, a we ma Ya Ikpe. Iji mezuo ihe ndi ahu iwu choro, O

gabigakwara ugwo zuru ezu nke iwu ahu choro n’onodu ndi ahu nile

n’otu n’otu O zubere izoputa. Ugwo ahu bu onwu: “...nkpuru obi nke

na-emehie, ya onwe ya ga-anwu” (Ezikiel 18:4b). Ya mere anyi naagutakwa

“I gaghi ahapuru ala mmuo (onwu) nkpuru obi m.” Nke a

na-egosi na Kraist nwuru onwu ma bilitekwa n’onwu ozo tutu O kee

uwa. Otu e siri ruzuo nke a nile bu nke e kechiri n’ime ihe omimi ahu

gbasara ihe nile Chineke bu.

Ya mere ugbu a, e nwere otutu ndi mmadu n’ime uwa a ndi

bu na, site na tutu e kee ihe okike, a hotaburu ha inwe nzoputa ma

burukwa ndi e were nye Kraist ka ha buru ihe onwunwe Ya ruo

ebighi ebi. Nmehie nile ha aburula nke e kpuchigoro kpamkpam ruo

mgbe ebighi ebi n’ihi na Jisos buuru Onye nzoputa ha site n’ikwu

ugwo maka nmehie nile ha obuna tutu e kee uwa.

Oke Igwe Ndi Mmadu A na-akabeghi Zoputa bu Ndi Chineke Naapughi

Ibibi

Taa, n’ime uwa nile, e nwere oke igwe ndi mmadu bu a naazoputaghi,

ma n’agbanyeghi ya, Chineke apughi ita ha ahuhu maka

nmehie ha. Olee ihe mere ya?

O bu n’ihi na ndi a buburi ndi Chineke hoputaburu ibu ndi a

ga-azoputa. Ya mere, n’oge di anya tutu a muputa ha, nmehie nile

7
joro oke njo ma ruo unyi nke ndi a a hoputara ga-emecha mee n’ime

oge nile nke ndu ha n’uwa ka e bokwasiri Onyenwe anyi Jisos. Jisos,

dika onye nnochite anya ha, onye no n’onodu ha, guzoro n’onodu ha

n’ihu oche eze ikpe nke Chineke. N’ihi nmehie nile ndi a, Jisos

aburula onye ikpe mara n’ihu iwu ziri ezi nke Chineke, Chineke

takwara Ya ahuhu maka nmehie nile ha.

Ya mere, ndi a bu ndi O nagidere onuma nke Chineke dika

ugwo maka nmehie nile ha buzi ndi e mere ka ha zie ezi ugbu a. Ya

bu, onye o bula n’ime ha n’otu n’otu, n’agbanyeghi udi oke njo

nmehie ha nile di, onuma nke Chineke, nke iwu Chineke choro ka o

buru ugwo maka nmehie ndi a, aburula nke e mezuru n’uzo zuru

oke. E mere ndi mmadu a ka ha zie ezi.

Ya mere, ka a na-amuputa ndi a nile n’otu n’otu n’ime uwa a,

e meela ya n’ezie n’ezie na o nweghi ka a taa ha ahuhu maka nmehie

ha. Kama ime nke a, o ruo n’otu oge n’ime ndu ha, e meela ya n’ezie

n’ezie na Chineke ga-etinye Okwu nke Chineke bu Baibul n’oru,

n’ime ndu ha, ha ga-anatakwa nkpuru obi ohuru a kpolitere n’onwu.

Nke a puru ime n’oge o bula Chineke hooro ime ka nke a mee. O

puru ime mgbe ha ka no n’ime akpa nwa nke nne ha ma o bu na nkeji

hour ole na ole tutu ha anwuo. O puru ime ma o buru na uche

ezuchaghi ha oke ma o bu na ha nwere uche okenye ogugu isi ya

zuru oke. Ndi mmadu a buburi ndi e mere ka ha zie ezi n’oge di anya

tutu a muputa ha.

O puru ime mgbe ha ka no n’ime akpa nwa nke nne ha

ma o bu na nkeji hour ole naole tutu ha anwuo

Mana o nweghi onye o bula ma e wezuga Chineke maara ndi

ha bu. O bu nani mgbe ha natasiri nkpuru obi ohuru ha a kpolitere

n’onwu, ya bu, mgbe a zoputachara ha, ka ha ga-amalitezi ighota na

Chineke azoputala ha. Mana nke bu eziokwu bu na e mebuolari ka

ha buru ndi ziri ezi site n’isi mbido nke oge n’ihi na Kraist bu Nwa

aturu e gburu site n’oge ito ntoala nke uwa (Nkpughe 13:8).

Mana, mgbe a ga-azoputa ha, ha ga-amata na ha aburula ndi

a zoputara nani n’ihi na Chineke n’ebube Ya dikarisiri uku

hoputaburu ha ma kwuo ugwo maka nmehie nile nke ha. Nzoputa

bukwa nke putara ihe n’ezie na ndu ha n’oge ahu Chineke zoputara

ha site n’inye ha ndu ebighi ebi nakwa nkpuru obi ohu a kpolitere

n’onwu.

Ya mere, n’oge nke a, n’ime uwa taa, e nwere oke igwe ndi

mmadu bu ndi na-agaghi akwu ugwo ma oli maka nmehie nile nke

8
ha kama ha ka na-ebi ndu n’ime nmehie, dika ndi ozokwa no n’uwa

sikwa na-ebi ndu n’ime nmehie.

Mmadu Nile Nwuru Anwu n’ime Mmuo site n’afo Nne ha

Anyi aghaghi imata na ndi mmadu nile a na-azoputaghi, ma

Chineke a hotara ha ibu ndi a ga-azoputa ka o bu na a hotaghi ha ibu

ndi a ga-azoputa, ha nile nwuru anwu n’ime mmuo. N’ime ahu

nakwa na nkpuru obi, ha bu ndi oria nmehie juputara kpamkpam. O

bu ya mere anyi ji aguta na Matiu 15:19:

N’ihi na n’obi ka ajo echiche nile, igbu mmadu nile, ikwa iko nile

nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, ikwa iko nile,

ori nile, ama ugha nile, nkwulu nile, si aputa:

Chineke na-akowa ndi ahu O zubere izoputa, gbasara otu ha

sibu ebi ndu tutu a zoputa ha, na ndi Efesos 2:3 anyi na-aguta:

Ndi anyi onwe anyi nile bikwara obi n’etiti ha n’oge gara aga n’ime

agu ihe ojo nke anu aru anyi, na-eme ihe nile anu ahu anyi na

echiche uche anyi choro, burukwa umu nke iwe dika e si mu anyi,

dika ndi foduru bukwa.

Dika iwu ziri ezi nke Chineke si mebe ya, ugwo maka nmehie bu nke a naaghaghi

ikwu akwu, ugwo ahu nke iwu nke Chineke chokwara bu mbibi.

Anyi aghaghi icheta kwa mgbe o bula na dika iwu ziri ezi

nke Chineke si mebe ya, ugwo maka nmehie bu nke a na-aghaghi

ikwu akwu, ugwo ahu nke iwu nke Chineke chokwara bu mbibi. O

bu nani mgbe a kwuchara ugwo ahu ka Chineke puru inye onye

nmehie ahu ndu, bu ndu ebighi ebi. O bukwa n’ihi na ugwo a choro

maka nmehie bu mbibi, n’ihi ya onye ahu a na-azoputaghi ka a gaebibi

ma kpochapu ya ruo mgbe ebighi ebi, o gaghikwa adi ndu ozo.

Chineke na-akowa mbibi a nakwa nkpochapu nke a zuru oke na

Nkpughe 20:14 ruo 15, bu ebe O na-ekwu si:

E we tuba onwu na Hedis n’ime odo oku ahu. Nke a bu onwu nke

abuo ahu, bu odo oku ahu. O burukwa na a hughi onye o bula ka e

dereri aha ya n’akwukwo nke ndu ahu, e we tuba ya n’odo oku

ahu.

9
Mgbe a ga-atuba mmadu n’ime odo oku ahu, e kpochapula

ya, bibie ya ruo mgbe ebighi ebi. O nweghi ma oli ma oli ka o dizie

ndu ozo. Nke a bu ihe “onwu nke abuo” ahu putara.

Mana, n’oge di anya tutu a muputa onye ahu, Kraist kwuru

ugwo maka nmehie nke ndi nile a hoputara, n’ihi nke a, onye ahu

aburula onye e mere ka o zie ezi n’iwu (ya bu, n’ime iwu ahu onye

ahu abughizi onye ikpe nmehie mara). Mana tutu Chineke n’ezie

etinye Okwu nke Chineke n’oru n’ime onye ahu ma nye ya nkpuru

obi ohuru a kpolitere n’onwu, oke iwe Chineke ga-adi n’ebe o no. Ya

bu, o ka bu oria nke nmehie, o ka bukwa onye nwuru anwu

kpamkpam n’ime mmuo. O ka di nnoo ka ozu na-esi isi (Jon 11:39)

nakwa ndagwurugwu nke okpukpu ndi kporo nku (Ezikiel 37:1 ruo

2). O nweghi ma oli ma oli ka o nwe ike igbanwe onodu onwu nke

ime mmuo nke udidi ya n’otu uzo ahu kwa onye nwuru anwu n’anu

ahu na-apughikwa idighachi ndu n’anu ahu ozo.

A Ghaghi Inye Anyi Nkpuru obi Ohuru

Nani Chineke puru inye ndu, dika a ga-ahu n’omumu a naamu

nwantakiri. Nwantakiri ahu apughi inye aka n’uzo o bula iji

nwete ndu nke anu ahu ahu. N’otu aka ahu kwa, onye o bula

Chineke hoputarala ibu onye a ga-azoputa, n’agbanyeghi na Kraist

akwubuolari ugwo maka nmehie nile ya, ma a ghaghi inye onye ahu

ndu ime mmuo. Na Jon 3, amaokwu 3 na 7, Chineke na-ekwu na nke

a bu “imu mmadu ozo.” Okwu Grik nke Chineke ji kowa ya n’ebe a

bu nke ihe o putara bu “imu mmadu ozo site n’elu.” Ozokwa, na I

Pita 1:23, Chineke na-akowaputa na omumu ohuru nke a bu mmadu

“ibu onye a muru ozo.”

Omumu ohuru nke a, nke sitere n’elu, ya bu, site n’eluigwe,

abughi nani na o bu nkpuru nke ndu nke ga-abu otutu oge gafe o

tolite n’ime ndu onye ahu a zoputara. O bu nkpuru obi ma o bu

mmuo nke ga-adi ohuru ozugbo. Nkpuru ahu bu Kraist n’onwe Ya

bu Onye bi n’ime onye ahu a zoputagoro (Jon 14:23). Chineke na-eme

ka anyi mara n’ezie na o bu nkpuru obi ohuru nke O kowara site n’iji

akuko ima atu bu mmadu ikwachi oghere di n’akwa ochie site

n’itinye akwa di ohu n’ebe ahu o dokara adoka. (Matiu 9:16). Ha nile

kwesiriri ibu akwa ohu. N’otu aka ahu, O na-enye akuko ima atu

gbasara mmadu itinye mmanya ohu n’ime karama ochie. A ghaghi

itinye mmanya ohuru ahu n’ime karama ohu (Matiu 9:17. A

kowakwara nke a nke oma n’uzo ebe abuo ndi ozo na Baibul, dika na

II Ndi Korint 5:17, bu ebe anyi na-aguta:

10
Ya mere o buru na onye o bula di n’ime Kraist, o bu onye e kere

ohu: ihe ochie agasiwo; le, ha aghowo ihe ohu.

Akuku di n’ime onye ahu nke na-aburu onye e kere ohu

ozugbo bu mmuo ohuru ya (nkpuru obi ohu a kpolitere n’onwu), nke

Chineke nyere ya n’oge ahu O tinyere Okwu nke Chineke n’oru

n’ime ndu onye ahu (Ezikiel 36:26). N’otu aka ahu kwa, o ruo n’isi

njedebe oge, onye nke a a hoputara ka a ga-enyezi ahu ime mmuo di

ohuru a kpolitere n’onwu, “N’oge dikarisiri nta, n’otu ntabi anya,

mgbe a ga-afu opi ikpeazu: n’ihi na a ga-afu opi, a ga-eme kwa ka

ndi nwuru anwu si n’onwu bilie na-apughi ire ure, a ga-enwokwa

anyi onwe anyi.” (I Ndi Korint 15:52).

N’ihi nke a, ilu ndi putara ihe, ndi na-akowa na mmadu

enweghidi ike o bula idi ndu n’ime mmuo, ya bu, iburu onye a

zoputara, ka e nyechara na Baibul. E weputara nke a n’Ezikiel 37, bu

ebe Chineke na-akowa na ndi mmadu a na-azoputaghi dika okpukpu

kporo nku, ma n’agbanyeghi ya, Chineke na-egosi na mgbe Chineke

ruru oru Ya, okpukpu ndi ahu kporo nku dighachiri ndu n’uzo zuru

oke. Ilu ozo gbasara ihe mebugoro eme bu nke e deturu na Jon 11, bu

ebe anyi na-aguta na ozu na-esi isi nke otu onye a kporo Lazaros

dighachiri ndu mgbe ahu Onyenwe anyi Jisos nyere ya iwu. N’otu

aka ahu kwa, Chineke bu nani Ya bu Onye puru iwete ndu nke ime

mmuo ga-adi ebighi ebi we nye ya mmadu bu onye ahu nwuru anwu

n’ime mmuo site n’afo nne ya.

Anyi ga-amara n’ezie na e nwere ndi mmadu

a na-azoputaghi n’udi abuon’ime uwa.

Anyi ga-amara n’ezie na e nwere ndi mmadu a naazoputaghi

n’udi abuo n’ime uwa. E nwere ndi nwuru anwu n’ime

mmuo bu ndi a hoputabugoro ma burukwa ndi onuma nke Chineke

na-adighizi n’ebe ha no n’uzo iwu si ahuta ya, e nwekwara ndi ahu a

na-agunyeghi na ndi a hoputagoro, n’ihi nke a, n’ezie, ha agaghi

enwe ndu ebighi ebi ma oli, ha ga-atakwa ahuhu nke onuma ikpeazu

nke Chineke. N’ime onodu abuo ndi a, n’agbanyeghi na ha nwuru

anwu n’ime mmuo, e edere iwu nke Chineke n’obi ha. Ya mere, ha

maara, ako na uche ha na-agbakwara ha ama na ha kwesiri irube isi

n’iwu nile nke Chineke.

Ozokwa, otu ihe di mkpa mebere udidi ha, bu nkpuru obi ha

ma o bu mmuo ha bu n’ime ya ka Chineke puru isi duruo ha n’inwe

agu miri emi karia, irube isi n’iwu nile nke Chineke, ma o bu

11
Ekwensu puru iduru ha n’inwe obi di njo karia. Gbakwunyekwara

nke a, n’ime udidi ha n’ozuzu ya e nwere ajo omume, onwu nke ime

mmuo, nke na-achoghidi enyemaka nke Ekwensu iji puta ihe

n’echiche ha, okwu onu ha, nakwa omume ha.

Ihe Nzoputa Nke Ndi A hoputara Bu n’ezie

Dika a rutugoro aka na ya, o nwere oru Chineke ozo di uku

nke a chokwara. Ndi ahu a hotara inwe nzoputa bu ndi mmadu nkiti

na-eme nmehie. Ha amaghi ihe o bula gbasara ihe ndi Chineke naezubere

ha. Atumatu nzoputa Chineke nyere ha bu nke a na-aghaghi

ime ka o puta ihe na ndu ha.

Tutu nzoputa abia o nweghi onye o bula n’ime agburu

mmadu nile maara ma Chineke ahotara ya ibu onye a ga-azoputa. O

bu nani mgbe Chineke zoputasiri anyi ka anyi ga-aghota na nani otu

ihe mere e ji gunye anyi n’ime atumatu nzoputa nke Chineke bu n’ihi

na Chineke dika o si di Ya ezi nma hotara anyi obuna tutu O kee

uwa. Dika ndi ozokwa so n’ime agburu mmadu bu ndi a na-agaghi a

zoputa, ndi a zoputara bukwa nnoo ahu na nkpuru obi. Ahu ha bu

akuku nke udidi ha ahu nke a ga-eli n’oge ha ga-anwu. N’ebe onye a

zoputara no, n’oge onwu nke anu ahu ya, nkpuru obi ma o bu mmuo

(nke bukwa otu akuku nke mebere udidi onye ahu n’ezie dika ahu ya

kwa) na-ahapu ahu ya, e we kporo ya laa n’ime eluigwe bu ebe o gaebi

ma soro Kraist chia. O ruzie n’oge nke isi njedebe uwa, mgbe

Kraist ga-alaghachi, O ga-akpolite ahu ahu (II Ndi Korint 5:8, I Ndi

Tesalonaika 4).

Mana, tutu nzoputa, onye ahu a hotara ga na-ebi ndu n’ime

uwa a dika onye nke ozo a na-ahotaghi inwe nzoputa si ebi.

Anyi na-aguta gbasara ndi a hotara na Ndi Efesos 2:1 ruo 3:

Unu onwe unu ka O mekwara ka unu di ndu, mgbe unu no n’onwu

site na ndahie nile unu na nmehie nile unu, nke unu jeghariri

n’ime ha n’oge gara aga n’uzo oge nke uwa nke a, dika onye isi nke

ike nke mbara eluigwe si cho, bu muo ahu nke na-alusi olu ike

n’ime umu nke ekwenyeghi ekwenye ugbu a; ndi anyi onwe anyi

nile bikwara obi n’etiti ha n’oge gara aga n’ime agu ihe ojo nke anu

ahu anyi, na-eme ihe nile anu ahu anyi na echiche uche anyi choro,

burukwa umu nke iwe dika e si mu anyi, dika ndi foduru bukwa:

Tutu a zoputa ya, n’ime ahu ya o na-enwe agu ime nmehie,

n’ime nkpuru obi ya o na-enwekwa agu ime nmehie. O nwuru anwu

n’ime mmuo dika onye nke ahu a na-agaghi azoputa.

12
Nke ahu na-edubatazi anyi n’oru nke ato di ukwu nke

Chineke nke O na-aru n’aha ndi ahu Kraist biara izoputa.

Oru ebube nke di N’omumu Ohuru ahu

Oru nke ato Chineke na-aru n’aha ndi ahu e nyegoro Kraist

ka ha buru ihe onwunwe Ya ruo mgbe ebighi ebi bu na O na-aru oru

ebube nke bu inye onye ahu a hoputara nkpuru obi ohuru a kpolitere

n’onwu. Jisos na-ekwu okwu banyere nke a na Jon 3:5, ebe anyi naaguta:

. . .N’ezie, n’ezie, asim i, O buru na a mughi mmadu site na mmiri

na Muo Nso, o pughi iba n’alaeze Chineke.

Tutu nke ahu, anyi na-aguta na Jon 3:3:

. . .N’ezie, n’ezie, asim i, O buru na amughi mmadu ozo, o pughi

ihu alaeze Chineke anya.

Imu mmadu site na mmiri nakwa Muo Nso putara imu

mmadu site n’Ozioma (mmiri), site n’oru nke Chineke Muo Nso (Jon

4:10 ruo 15, Jon 7:38). Chineke na-ekwu maka oru nke a na Ndi Rom

10:17, bu ebe O na-ekwu:

Ya mere, okwukwe si n’onunu puta, ma onunu ahu sitere n’okwu

Kraist.

N’ime oru nhazi di nso nke Chineke, O guzobere ebe ahu O ga

na-azoputa ndi mmadu n’ime ya.

N’ime oru nhazi di nso nke Chineke, O guzobere ebe ahu O

ga na-azoputa ndi mmadu n’ime ya. Ebe ahu bu Baibul, bu nani ya

bu Okwu nke Chineke. Ya mere, o bu ihe na-apughi ime eme mmadu

o bula n’ime uwa ibu onye a zoputara bere nani ma ha anuru okwu

ndi sitere na Chineke, nani Okwu nke Chineke bukwa Baibul. O bu

ya mere na n’ime oge nke ogbo uka Chineke nyere ndi nzuko uka

nile iwu ka ha zisa Ozioma n’ime uwa nile. O bu ya mere na n’ubochi

anyi a anyi kwesiri iga n’ihu tinyesie uchu ike n’izisa Ozioma n’ime

uwa, mana ugbu a anyi ga-eme nke a n’onwe anyi karia ime ya dika

otu uka. Anyi n’onwe anyi n’otu n’otu ga-ejere Kraist ozi dika ndi

nnochite anya.

13
Anyi kwesiri imata na taa o nweghi mmadu o bula a puru

izoputa n’ime uka nile. Dika usoro nguko oge Chineke si di, oge nke

ogbo uka abiala n’isi njedebe, Muo Nso ahapukwala uka nile. Mana,

Baibul na-akuziri anyi na n’ebe ndi na-abughi n’ime uka, na oke

owuwe ihe ubi nke ndi kwere ekwe n’ezie ka a na-akpobata n’ime

alaeze nke Chineke. (A na-akpo gi oku ka ikpoturu Family Radio ma

juo ase maka inwete akwukwo ndi a a na-enye n’efu, The End of the

Church Age and After nakwa Wheat and Tares.)

Chineke na-aru oru nile di n’izoputa, ya mere O puru izoputa

onye ahu a hoputara n’oge o bula n’ime oge nke ndu onye ahu. Nani

ihe a choro bu na onye ahu ga-ano n’onodu inu ihe sitere na Baibul.

N’oge nzoputa onye ahu, Chineke na-enye onye ahu nti ime mmuo

nakwa nkpuru obi ohuru ga-adi ruo ebighi ebi. N’ihi nke a, dika m

kwuburu na mbu, nwa ohuru o bula puru ibu onye a zoputara n’otu

uzo ahu o dikwazi n’ebe onye okenye no. Onye ahu nwere uche

nwantakiri gbara afo abuo puru ibu onye a zoputara n’otu uzo ahu o

dikwazi n’ebe onye oka nmuta koleeji no.

N’obe, Kraist gosiputara ka a hu otu O sibu taa ahuhu tutu O

kee uwa, mgbe ahu O kwuburu ugwo maka nmehie nile nke onye

ahu a hoputara. Ya mere, ihe foduziri ime bu na o ruo n’oge o kwesiri

nke naani Chineke maara, Chineke ga-eme onye a ka o mata n’ezie na

o nwetela nzoputa.

Ka o di ugbu a n’omumu anyi, anyi amalitela imuta ihe iwu

nke Chineke, bu Baibul, choburu ka Chineke me. Ajuju nwere ike di

anyi n’obi bu: olee ihe m puru ime iji buru onye a zoputara? O nwere

uzo o bula m puru iji hu n’ezie na a gunyere m n’ime ndi ahu a gaahoputa

inwe nzoputa? N’ime omumu anyi, anyi ga-eleba anya nke

oma n’ime ajuju ndi a di nnukwu mkpa.

Oru nke Ime Mmuo Dika Baibul si akowa Ya

N’oge ugbu a n’omumu anyi, anyi kwesiri iwebata otu ihe

ozizi nke metutara isiokwu a bu mmadu ibu onye a zoputara n’ebe o

di ukwu. O bu ihe gbasara otu Baibul si akowa okwu a bu “oru” ime

mmuo. Baibul na-ekwu ya ugboro ugboro na nzoputa anyi enweghi

ma oli ka o bia site n’oru o bula nke anyi na-aru (Ndi Efesos 2:8 ruo 9,

Ndi Galetia 2:16). Ya mere, anyi aghaghi imata otu Chineke si akowa

okwu a bu “oru” ime mmuo.

Na Jona 3:10, Chineke na-ekwuputa:

Chineke we hu oru nile ha, na ha siri n’uzo ojo ha chigharia;

Chineke we chegharia uche banyere ihe ojo ahu, nke O kwuru, si

na O ga-eme ha; O meghi kwa ya.

14
Na Matiu 7:22, Chineke na-ekwuputa:

Otutu ndi mmadu ga-asi m n’ubochi ahu, Onyenwe anyi, Onyenwe

anyi, anyi ejighi aha Gi bu amuma, anyi ejighi kwa aha Gi chupu

ndi muo ojo, anyi ejighikwa aha Gi lu otutu olu di ike?

Mgbe o bula anyi ga-erube isi n’iwu nke Chineke,

anyi na-aru oru na-ato Chineke uto.

Site n’amaokwu ndi a nakwa amaokwu Baibul ndi ozo, anyi

na-amuta na oge o bula anyi ga-erube isi n’iwu nke Chineke, na anyi

na-aru oru nke na-ato Chineke uto. Mgbe o bula anyi ga-enupu isi

n’iwu nke Chineke, anyi na-aru oru nke na-adighi ato Chineke uto.

Dika ima atu, Baibul na-enye mmadu nile iwu ka ha kwere na Kraist.

Ikwere n’ihe, o bu oru nke anyi na-aru aru? N’ezie o ihe o bu. Okwu

a bu “kwere” bu ngwaa nke sitere n’okwu a bu “okwukwe.” Baibul

na-ekwu okwu n’uzo doro anya na I Ndi Tesalonaika 1:3 nakwa II

Ndi Tesalonaika 1:11 banyere “oru nke okwukwe.”

I Ndi Tesalonaika 1:3, na-agwa anyi:

Ebe anyi na-echeta na-ewepughi aka oru nke okwukwe unu na

ndogbu n’oru nke ihunanya unu na ntachi obi nke olileanya unu ji

ele anya Onyenwe anyi Jisos Kraist, n’iru Chineke anyi, bu Nna

anyi;

Ozokwa na II Ndi Tesalonaika 1:11, anyi na-aguta:

O bukwa nke a ka anyi ji na-ekpekwa ekpere banyere unu mgbe

nile, ka Chineke we gua unu na ndi kwesiri okpukpo a kporo unu,

ka O werekwa ike mezuo ihe nile o bula nke diri idi nma ezi nma

na oru nile o bula nke okwukwe;

N’uzo putara nnukwu ihe, Chineke na-ekwu maka oru nke

okwukwe nakwa ndogbu n’oru nke ihunanya. Ya mere, anyi puru

ighota n’uzo doro anya na mmadu inwe okwukwe nakwa inwe

ihunanya, bucha oru ndi nke anyi na-aru. N’otu aka ahu, irube isi

nyere iwu o bula di n’ime Baibul bucha oru nke e tiri anyi iwu ka

anyi ruo. Ya mere, anyi aghaghi icheta na mgbe Chineke na-enye

anyi iwu ka anyi kpe ekpere, ka anyi cho Kraist, ka anyi buru ndi a

zoputara, ka anyi kpokuo Chineke, ka anyi chere oge Chineke, ka

anyi guo ma muo Baibul, w.d.g., na n’ime ntimiwu nile ndi a,

15
Chineke na-etiri anyi iwu ka anyi ruo oru. O bu ya mere Chineke ji

akowa na “ihunanya” bu idebe iwu ndi ahu Chineke nyere, dika ima

atu. Mgbe anyi na-ahu Chineke n’anya ma hukwa onye agbataobi

anyi n’anya, anyi na-aru oru ime mmuo. Ukpuru nke a, nke bu na

irube isi n’iwu o bula bu oru anyi na-aru aru, bu ukpuru nke di

nnukwu nnukwu mkpa nke anyi na-ekwesighi ichefu ma oli dika

anyi na-elezi anya nke oma na-amu amaokwu ndi di na Baibul nke

metutara mmadu iburu onye a zoputara.

Kraist Ruru Oru Nile A choro maka Nzoputa Anyi

O nwekwara ukpuru ozo di nnukwu nnukwu mkpa nke anyi

na-aghaghi icheta kwa mgbe o bula. Nke bu na oru nile e kwesiri iru

iji zoputa mmadu bu nani Chineke puru iru ya. Ihoputa ndi ahu

Chineke zubere izoputa, ugwo nke Kraist kwuru n’aha ndi ahu O

biara izoputa, nkpuru obi ohuru nke Chineke na-enye ndi ahu O naazoputa:

ihe nile ndi a bucha oru nke nani Chineke puru iru.

Oru nke a choro iji zoputa mmadu bu nani Chineke puru iru ya.

Nke bu eziokwu bu na, nhoputa ahu bu nke e mebugoro tutu

mmadu adi. Ozokwa, ugwo maka nmehie nke ndi a hoputara bu nke

a kwuzuru site na tutu ntoala nke uwa (Nkpughe 13:8). Ya mere, o bu

ihe na-apughi ime eme ma oli mmadu ime ihe o bula iji nyere aka

obunagodu nwantakiri n’inwete nzoputa.

Gini Meziri Chineke Ji Enye Anyi Iwu Ndi a?

Chineke na-enye anyi iwu ndi a, ka anyi kwere, kpe ekpere,

w.d.g., mana olee otu anyi puru isi malite we rube isi n’iwu ndi a?

Anyi nwuru anwu n’ime mmuo. Chineke na-akowa na ndi mmadu a

na-azoputaghi dika ndagwurugwu nke okpukpu kporo nku juputara

(Ezikiel 37:1 ruo 14) nakwa dika ozu na-esi isi (Jon 11:39). Chineke

na-ekwusikwa ya ike na Ndi Rom 3:10 ruo 12:

Dika e deworo ya n’akwukwo nso, si, O dighi onye bu onye ezi

omume, o dighi otu onye ma oli; o dighi onye na-aghota, o dighi

onye na-acho Chineke; Ha nile ewezugawo onwe ha, ha nile abaghi

n’ihe n’otu; O dighi onye na-eme ihe oma, o dighi obuna otu onye.

16
N’eziokwu, Baibul na-akowaputa n’uzo doro anya na ndi

mmadu a na-azoputaghi nwuru anwu n’uzo zuru oke. Anyi aghaghi

icheta na mmadu, malite n’odida nke Adam, nwuru anwu n’ime

mmuo dika o bu na Chineke ebighi n’ime ha, ha abughikwa ndi

Chineke nyere ike nke ime mmuo. N’ihi nmehie nke mmadu, onuma

nke Chineke di n’ebe o no, nke ahu putakwara na o ruo n’isi njedebe

nke uwa a ga-ebibi ya, o gaghikwa adizi ndu ozo. Dika anyi

kwuburu na mbu, n’ime odidi ahu ya n’ozuzu ya o bu onye oria

nmehie bamiri ime.

Mana, n’agbanyeghi na o nwuru anwu n’ime mmuo, ma o ka

nwere ike irube isi n’iwu ndi Chineke nyere. Ya mere, o puru

ikwenyetu na Kraist, o puru ikpe ekpere, o puru icho Chineke, o

puru isi na nmehie chigharia, dika inu oke mmanya n’aba n’anya,

ikwu okwu ugha, w.d.g. O nwere ike n’ime ya ime nke a n’ihi uzo ihe

abuo.

Ihe nke mbu mere ya bu na o ka nwere ako na uche nke puru

ima ya ikpe nmehie ya (Ndi Rom 2:14 ruo 15, Jon 8:9). Nke a di otu a

n’ihi na mmadu bu onye e kere n’oyiyi nke Chineke,

n’agbangyehikwa na nnukwu nkewa adila n’etiti ya na Chineke, ma

iwu nke Chineke ka ditu n’ime ya.

Ihe nke abuo mere ya bu na Chineke puru imezu uche Ya

n’ime ndu onye ahu a na-azoputaghi n’agbanyeghi na o bughi

ebumnuche Chineke izoputa onye ahu. Anyi na-ahu ukpuru nke a

n’oru n’ime ndu ajo nwoke ahu bu Belaam (Onu Ogugu 22:12 ruo

13), nakwa na ndu Sol, eze mbu nke Israel (I Samuel 10:9 ruo 12).

Ozokwa, o buru na Chineke ahoputala onye ahu a naazoputaghi

ma kwubuo ugwo maka nmehie ya nile, tutu Chineke

enye onye ahu obi ohuru n’ezie, bu nkpuru obi ohu a kpolitere

n’onwu, Chineke Nna nwere ike na-adota ya (Jon 6:44).

Mana, dika onye a na-agbalisi ike irube isi n’iwu ndi nke Chineke, o

nweghi ma oli ma oli ka o mara ma nke o bula n’ime ihe ndi a o bu ha

na-eme ya ka o gbalia irube isi n’iwu ndi Chineke tiri. Ya bu, o

nweghi ihe akaebe o bula, o kwesighikwa iche obuna nwantakiri oge

na nrube isi ya ga-ebuteriri ya nzoputa.

Mmekorita Di Omimi nke di n’etiti Chineke na Mmadu

Ozokwa, e nwere nmekorita nke ime, di omimi, ma di ike nke

di n’etiti Chineke nakwa mmadu nile n’otu n’otu no n’ime agburu

mmadu. Nke a bu ezie o bughi nani n’etiti Chineke na ndi ahu O

hoputagoro inwe nzoputa, kama o di otu a n’ezie n’etiti Chineke

nakwa ndi ahu O na-ahoputaghi, bukwa ndi ahu, a ga-ebibiriri

n’ezie.

17
Anyi na-ahu na nke a bu ezie dika o bu na Jisos kwaara

Jerusalem akwa (Luk 19:41), n’agbanyeghi na ihe akaebe nke e nyere

na Baibul na-agwa anyi na imerime n’ime ndi Jerusalem a O na-ekwu

maka ha ka a ga-ebibi. Anyi na-ahu na nke a bu ezie dika o bu na

Baibul na-ekwputa na Chineke anaghi enwe obi uto n’onwu onye ajo

omume (Ezikiel 33:11). Anyi na-ahu nke a bu ezie dika o bu na e dere

iwu nke Chineke n’obi mmadu nile e kere eke (Ndi Rom 2:15).

Anyi na-ahu na nke a bu ezie dika o bu na n’ime iwu nke

Chineke, onye ogbu mmadu aghaghi inwu n’ihi na o gbuola mmadu

bu onye e kere n’onyinyo nakwa oyiyi nke Chineke (Jenesis 9:6).

Anyi na-ahu nke a n’iwu nke Chineke tiri ka anyi hu ndi iro anyi

n’anya. Anyi aghaghi icheta na onye o bula a na-ahoputaghi bu onye

iro nke Chineke, ma n’agbanyeghi ya o nweghi mmadu o bula anyi

na-agaghi ahu n’anya. Anyi na-ahu nke a n’ido aka na nti nke

Chineke na-enye na Matiu 5:22, kwuo na anyi agaghi akpo mmadu

“Raka,” ya bu, onye enweghi uru o bara ma o bu onye nzuzu. Anyi

agaghi elekwasi onye o bula di ndu anya ka a ga-asi na olileanya

adirighi onye ahu inwe nzoputa.

Site n’ihe akaebe ndi a, anyi puru ikwubi na n’agbanyeghi na

mmadu buuru onye nwuru anwu n’ime mmuo n’ihi nmehie ya,

nakwa na Chineke anaghizi etinye ike n’ime onye ahu ma o bu na

Chineke ebighizi n’ime onye ahu, ma etufughi onye ahu,

ebechapughikwa ya puo n’ebe Chineke no. N’ime onodu nke inwu

anwu n’ime mmuo ya nakwa ibu onye a na-azoputaghi, o ka nwere

ihe diri ya ime n’udi na o kwesiri irubere Chineke isi, nakwa n’ezie, o

ka nwere ike n’ime ya irubere Chineke isi. O bu nani n’ubochi

ikpeazu ka a ga-ebechapu ya kpamkpam n’ebe Chineke no (Aisaia

66:24, Jeremaia 23:39 ruo 40, 24:10).

Ya mere, mmadu nile n’otu n’otu ka Chineke ga-atu anya

n’aka ha iru oru nke ikwere Chineke ka we gbalitu irube isi n’iwu ndi

nke e tiri na Baibu. Dika a rutuburu aka na ya na mbu n’ime omumu

anyi a, nrube isi nke a bu nke a puru ime ka o putawanye ihe site na

Chineke n’onwe Ya iru oru n’ime mmadu, nke bukwa otu o sibu diri

ajo nwoke ahu bu Belam (Onu Ogugu 22 nakwa 23), ma o bu o puru

ibu Chineke na-aru oru n’ime ndu onye ahu bu onye Chineke

hoputara kama a kabeghi nye onye ahu nkpuru obi ohuru nke ga-adi

ruo ebighi ebi. (Jon 6:44).

Chineke nwere ikikere igwa mmadu ka o rube isi n’iwu Ya nile.

Anyi aghaghi ichetakwa na Chineke nwere ikikere igwa

mmadu ka o rube isi n’iwu Ya nile. N’ihi na mmadu bu onye e kere

18
n’onyinyo nakwa oyiyi nke Chineke, mmadu, dika Chineke n’onwe

Ya, bu onye no n’okpuru akwukwo iwu nke Chineke, bu Baibul. Ya

mere, anyi kwesiri ighota na oru nke ikwere na Kraist bu nke a puru

ihu n’ime ndu nke onye a na-azoputaghi bu onye nwere ike o buru

na a hoputara ya ibu onye a zoputara ma o bukwanu na a hoputaghi

ya. Dika o na-ekwere na Kraist, o ga-agbalisi ike igbaso iwu nke

Baibul nke Luk 13:24, bu ebe Chineke na-ekwu si:

Jisienu ike isi n’onu uzo di warawara ba: n’ihi na otutu mmadu, ka

M si unu, ga-acho iba n’ime ya, ma ha agaghi enwe ike.

Nakwa na Ndi Hibru 4:11, bu ebe anyi na-aguta:

Ya mere ka anyi na-anu oku n’obi iba n’izu ike ahu, ka onye o bula

ghara ida n’otu ihe nnomi ahu nke ekwenyeghi ekwenye.

Mana, ozokwa aghaghi m ikowaputa ya ka o doo anya na o

nweghi oru o bula nke ikwere puru ime n’ezie ma o bu tinye utu

n’udi o bula n’ime ka onye ahu buru onye a zoputara n’ihi na oru nile

a choro maka iwete nzoputa bu nke Kraist ruru n’uzo zuru oke n’oge

di anya tutu a muputa onye ahu.

O nweghi oru o bula nke ikwere nke puru ime n’ezie ma o bu tinye

utu n’udi o bula n’ime ka onye ahu buru onye a zoputara n’ihi na oru nile

a choro maka iwete nzoputa bu nke Kraist ruru n’uzo zuru oke n’oge di

anya tutu a muputa onye ahu.

O bu ihe magburu onwe ya na, dika onye a na-azoputaghi naagbasi

mbo ike ime ihe Chineke na-acho, ngozi abuo di uku ka a gaemezu.

Ngozi nke mbu bu na dika onye ahu a na-azoputaghi naagbali

irube isi n’iwu ndi ahu Chineke tiri, o ga-abuzi ihe kwesiri

ekwesi na ya onwe ya ga na-amatawanyezi ihe di na Baibul. Nke a

ga-ewebata otutu ihe uru n’ime ndu ya dika o na-amuta ihe gbasara

eziokwu ndi di mkpa dika ihe banyere otu nmehie si jogbue onwe ya,

ugwo maka nmehie, ikpe ziri ezi nke Chineke, nakwa ebere nke

Chineke.

Nke abuo, o ga-edebe onye ahu n’onodu inu Okwu nke

Chineke. N’ihi nke a, O buru na Chineke na-ezube izoputa onye ahu,

onye ahu ga-ano n’onodu kwesiri ekwesi ka Chineke we tinye Okwu

nke Chineke n’oru n’obi ya.

19
Chineke Na-anwale Mmadu

O nwere ihe nke ato mere Chineke ji enye ndi mmadu iwu ka

ha ruo oru nke ikwere. Nke ahu na-enye onye ahu otutu ihe nwale

nakwa onwunwa. O ga-amalite iche na mgbali o na-agbali irube isi

n’iwu ndi nke Chineke tiri na nke ahu na-enyere aka n’inye ya

nzoputa?

Chineke na-anwale mmadu kwa mgbe kwa mgbe. Adam na

Iv bu ndi a nwalere n’ime Ogige Ubi nke Iden. Ha dara ihe nwale

ahu, nmehie batakwara n’ime uwa. Abraham bu onye a nwalere site

n’inye ya iwu ka o chuo nwa ya n’aja (Jenesis 22). O dadghi ihe nwale

ahu. Ndi Israel ka a nwalere n’uzo di iche iche n’ime afo ruru 40 ha

no n’ozara. Ha dara ihe nwale ndi ahu. Onye kwere ekwe n’ezie ka a

na-anwale kwa ubochi n’ihi na o ka nwere ahu nke na-enwe agu ime

nmehie. Chineke nwalere Jisos, nye Ekwensu ohere ka o nwa Ya

onwunwa. Ihe magburu onwe ya bu na, O daghi nwale ahu.

Ya mere, n’otu aka ahu, iwu ahu e nyere ka mmadu ruo oru

nke ikwere nakwa oru nke ikpoku Chineke maka inwete nzoputa bu

ihe nwale. Anyi aga-aghotakwa n’ezie na, n’agbanyeghi na ihe ndi a

bu iwu ndi nke Chineke tiri, nke mmadu na-aghaghi irube isi na ha,

ma nrube isi nyere iwu ndi a apughi ibutere anyi nzoputa ma oli?

Atumatu nwale nke a bu nke di mkpa n’ebe o di ukwu.

Mmadu nwere mpako dika ebum puta uwa, o na-anukwa ya oku

n’obi inara ekele nakwa otuto maka ihe o bula nke o mezuru site

n’oru aka ya.

Ozokwa, n’ezie, otutu ndi mmadu anaghi enwe ntukwasi obi

na Chineke ga-azoputa ha bere nani ma ha onwe ha ejiri oru aka ha

we mee ka atumatu nzoputa malite na ndu ha.

Anyi agaghi anwa anwa chee na oru o bula anyi ruru n’onwe anyi puru

inyere aka n’ezie, obuna nwa ntiti, n’ime ka anyi buru ndi a zoputara.

Mana Chineke na-ekwo ekworo ziri ezi. Chineke ruru oru

nile iji zoputa anyi. Ya mere, anyi agaghi anwa anwa chee na oru o

bula anyi ruru n’onwe anyi puru inyere aka n’ezie, obuna nwa ntiti,

n’ime ka anyi buru ndi a zoputara.

Oke mkpa Izu ike nke Ubochi Nke Asaa Di

Eziokwu a di nnukwu mkpa bu nke e gosiputara n’uzo di

itunanya n’ime Akwukwo Nso Agba Ochie. Anyi aghaghi icheta na

20
izu ike nke ubochi nke asaa bu nke e mere na nzuko ahu nke bu mba

Israel ga-edebechasi iwu ya nile nke oma. O bu iwu emume nke naarutu

aka n’eziokwu ahu nke bu na oru nile nke nzoputa bu Chineke

na-arucha ha nile. Obuna dika mba Israel si buru ndi na-agaghi aru

oru n’udi o bula n’ubochi izu ike nke ubochi asaa, n’ihi ya, anyi

agaghi aru oru n’udi o bula n’inye aka na nzoputa anyi. N’Opupu

31:13 ruo 14, Chineke na-ekwuputa si:

Gi onwe gi kwa, gwa umu Israel okwu, si, N’ezie ubochi izu ike M

nile ka unu ga-edebe: n’ihi na ihe iriba ama ka o bu n’etiti Mu na

unu ruo ogbo unu nile; ka unu we mara na Mu onwe M bu Jehova

nke na-edo unu nso. Unu ga-edebekwa ubochi izu ike M; n’ihi na

nso ka o diri unu: onye na-eme ya ka o ghara idi nso, a ghaghi ime

ka o nwuo: n’ihi na onye o bula nke na-eje ozi n’ime ya, a ga-ebipu

onye ahu n’etiti umu nna ya.

N’ime amaokwu ndi a na-agba ama, Chineke na-eweputa otu

ukpuru di nnukwu mkpa na Chineke aruola oru nile iji do anyi nso.

Okwu a bu “ido nso” putara idebe iche maka oru ijere Chineke ozi.

Anyi bu ndi e debere iche maka oru ijere Ya ozi bu mgbe ahu a gaazoputa

anyi. N’ime akuku akwukwo nso nke a, Chineke naekwuputa

na O ruru ihe nile a choro iji do anyi nso ma o bu zoputa

anyi.

Dika ihe iriba ama na-egosi nkuzi nke a di mkpa n’ebe o di

ukwu, Chineke tiri iwu na o nweghi oru o bula a ga-aru n’ubochi nke

asaa nke izu ike. Onye o bula ruru oru n’ubochi nke asaa nke izu ike

di nnoo ka onye ahu kweere na oru ya nke ime mmuo nyere aka

n’otu uzo iji ruzuo nzoputa ya. Onye di otu a ka a ga-egbu, ya bu,

onye di otu a ka ga-anata oke iwe nke Chineke.

Chineke na-enye anyi ihe atu iji gosiputa otu eziokwu nke a

si di oke mkpa. N’Onu Ogugu 15, amaokwu 32 ruo 36, Chineke naekwu

maka otu nwoke onye chikotara nku osisi n’ubochi nke asaa

nke izu ike. Nke a bu nani ntakiri imebi iwu nke ahu e nyere ka a

ghara iru oru o bula n’ubochi nke asaa nke izu ike.

Ma n’agbanyeghi ya, mgbe Moses juru Chineke ihe

ntaramahuhu tosiri ibu nyere obere nmebi iwu nke ahu e tiri gbasara

ubochi nke asaa nke izu ike, Chineke nyere ntuziaka ka e were

nkume tugbuo nwoke a. Oke ihe itunanya a merenu na-egosiputa otu

eziokwu ahu si di oke mkpa, na anyi ga-agba mbo hu n’ezie n’ezie na

anyi ghotara na nzoputa bu nani site n’oru nke Kraist.

EBERE ADIRIGHI NDI AHU NA-ECHE NA HA PURU IWETE MA O

BU NYERE AKA N’UZO O BULA N’INYE ONWE HA NZOPUTA.

21
Anyi agaghi anwa anwa che na anyi nyere aka na nzoputa

nke anyi site n’irube isi n’iwu nke Chineke. Cheta, nrube isi o bula

nyere iwu bu oru ime mmuo nke anyi na-aru. N’eziokwu, site n’ilu

nke a na-akowa ogbugbu e gburu nwoke a chikotara nku osisi

n’ubochi nke asaa nke izu ike, Chineke na-etisara anyi mkpu si:

EBERE ADIRIGHI NDI AHU NA-ECHE NA HA PURU IWETE MA

O BU NYERE AKA N’UZO O BULA N’INYE ONWE HA

NZOPUTA.

Ngozi nile nke Di N’atumatu Nwale Chineke

Atumatu nwale nke a bu nnukwu ngozi nyere ndi ahu

kweere na a zoputala ha. Na II Ndi Korint 13:5, Chineke tiri iwu si:

Na-anwanu onwe unu, ma unu di n’okwukwe anyi; naanwaputanu

onwe unu. Ma o bu unu amazughi onwe unu, na Jisus

Kraist no n’ime unu? ma o bughi na o bu ezie na unu bu ndi a juru

aju.

Olee otu anyi puru isi gosi onwe anyi n’eziokwu na a

zoputala anyi n’ezie? Otu ihe buru ibu anyi puru ime bu inyocha otu

ahu anyi si ekwere na e si na ya zoputa anyi.

Anyi ga-agba mbo hu n’ezie na anyi hapuru udi echiche o

bula ma o bu nkwenye anyi nwere n’obi anyi, na eleghi anya anyi

emeela nke a ma o bu nke ozo, na n’ihi nke a, na anyi butere ma o bu

nyere aka n’udi o bula na nzoputa anyi. Anyi ga-ahuriri n’ezie na

anyi jidere ukpuru nke sitere na Baibul aka nke oma, na o buru n’ezie

na a zoputala anyi, oru nile di n’izoputa anyi bu Kraist ruburu ya

n’oge di anya tutu a muputa anyi. Nzoputa bu nke a ruzuburu

kpamkpam site n’oru nke Kraist, anyi apughikwa ime ihe o bula iji

nyere aka n’iburu ndi a zoputara. Anyi aghaghi ighota na obuna oru

nke dikarisiri nta, ya bu, irube isi n’iwu o bula Chineke tiri, apughi

inyere anyi aka n’ibu ndi a zoputara. Ikpe nke dakwasiri nwoke ahu

chikotara nku osisi n’ubochi nke asaa nke izu ike kwesiri iba anyi na

nti.

Gbakwunyekwara nke a, anyi ga-anwale onwe anyi site

n’inyocha onwe anyi mara ma anyi adikwa dika a kowara n’asusu

nke

I Jon 2:3 ruo 6, ebe anyi na-aguta:

N’ime nke a ka anyi makwara na anyi amawo Ya, ma o buru na

anyi edebe ihe nile O nyere n’iwu. Onye na-asi, Amawo M Ya, ma

o dighi edebe ihe nile O nyere n’iwu, o bu onye ugha, eziokwu

22
adighikwa n’ime onye ahu: ma onye o bula nke na-edebe okwu Ya,

o bu n’ime onye ahu ka e meworo ka ihunanya Chineke zuo oke

n’ezie. N’ime nke a ka anyi maara na anyi no n’ime Ya: onye na-asi

na o na-anogide n’ime Ya, o ji ugwo ka ya onwe ya na-ejeghari kwa

dika Ya onwe Ya jeghariri.

Onye o bula a zoputarala n’ezie aburula onye e nyegoro

nkpuru obi ohuru a kpolitere n’onwu, ya mere, o ga na-enwe obi uto

n’ime ihe Chineke na-acho kwa mgbe o bula. N’ezie dika onye isi abu

n’Abu Oma 139:23 ruo 24, o ga na-ekpe ekpere si:

Gwuputa ala obi m, Chineke, we mara obi m: Na-anwa m, we mara

iche uche m nile: Hukwa ma o di uzo o bula na-ewete ihe ngbu di

n’ime m, Durukwa m n’uzo ebighi ebi.

Chineke na-eme ka Atumatu Nwale Ya Rawanye ahu

Ihe nwale nke iwu ndi a na-eweputa bu nke a na-eme ka o

rawanye ahu n’ihi na n’agbanyeghi na onye ahu a na-azoputaghi

nwuru anwu n’ime mmuo nakwa na oke iwe Chineke di n’ebe onye

ahu no, ma o ka nweturu ike n’ime ya irube isi n’iwu ndi ahu

Chineke tiri. N’oge gara aga n’ime omumu a, anyi mutara ihe ndi nke

a na-esote.

1. Onye ahu a na-azoputaghi ka nwere ako n’uche nke puru

ima ya ikpe nmehie. Nke a bu n’ihi na e dere iwu nke Chineke n’obi

onye ahu (Jon 8:9, Ndi Rom 2:14 ruo 15).

2. Chineke puru ime onye ahu nwuru anwu n’ime mmuo,

dika ima atu, Belam nakwa Eze Sol n’ime Akwukwo Nso Agba

Ochie, ka o mee uche Ya n’agbanyeghi na Chineke anaghi ezube

izoputa onye ahu (Onu Ogugu 22:12 ruo 13, II Pita 2:15 ruo 16, I

Samuel 10:9 ruo 12, I Ihe Emere 10:13).

Ya mere, n’agbanyeghi na mmadu nwere ike na-agbalisi ike

irube isi n’iwu ndi ahu Chineke tiri, ma o gaghi ama ma o bu

Chineke na-aru oru n’ime obi ya ka o bu ako na uche ya na-ama ya

ikpe. O gaghikwa ama ma o na-agbali iji obi ya nile rubere Chineke

isi. Mana o ghaghi ima na o nweghi mgbali ya nile o na-agbali ime

Chineke obi uto puru iwetere ya nzoputa ma o bu me n’ezie ka o

nwete nzoputa ma o bukwanu mezuo ihe ndi ahu a choro iji me ya ka

o buru onye a zoputara.

23
O nwekwara ike na-eche ihe na-ezighi ezi na n’ihi na

o na-erube isi n’iwu ndi a, na Chineke ga-azoputa ya.

Mgbe onye a na-azoputaghi ga-amalite irube isi n’iwu ndi

ahu Chineke tiri, o di mfe ya onwe ya idaba n’onya nke iche n’obi ya

na nrube isi ya bu ihe akaebe na-egosi na Chineke azoputala ya. O

nwekwara ike na-eche ihe na-ezighi ezi na n’ihi na o na-erube isi

n’iwu ndi a, na Chineke ga-azoputa ya. N’ime onodu abuo ndi a, o

na-emebi iwu nke Chineke nke na-ekwu na o nweghi oru nke onye o

bula na-aru puru itinye utu na nzoputa ya. N’agbanyeghikwa na o bu

atumatu nke Chineke inwale mmadu iji mara ma o ga-erube isi n’iwu

nile nke Chineke, ma e wezuga ebere nke Chineke, mmadu nile gaada

ihe nwale ahu.

A ga-ahu nke a n’uzo di itunanya, n’omume ndi Israel nke

oge ochie. Chineke gwara ha na o buru na ha rube isi n’iwu nile

Chineke tiri, O ga-agozi ha ruo ebighi ebi (Deuteronomi 28:1, 28:15,

30:6 ruo 16).

Ya mere, ha gbaliri ime ezigbo omume ruo otu ike ha ha, nwe

ntukwasi obi na site n’uzo di otu a nzoputa ga-abiara ha. Mana, o di

nwute na Chineke na-agwa anyi na Ndi Rom 9:31 ruo 32:

Ma Israel, o bu ezie na ha na-agbaso iwu ezi omume, ma ha

ekwudoghi iwu ahu. N’ihi gini? N’ihi na ha esiteghi n’okwukwe

cho ya, kama dika a ga-asi na ha sitere n’oru cho ya. Ha suru

ngongo na nkume nke iso ngongo ha;

Mgbe mmadu o bula ga-etinye uchu na-agbali ibu onye a

zoputara, o di mfe ya onwe ya idaba n’onya nke iche n’obi ya na

nrube isi ya ga-ebute ma o bu wetere ya nzoputa. O di nnoo ka o naaru

oru n’ubochi nke asaa nke izu ike, dika nwoke ahu chikotara nku

osisi ole na ole.

Ihe anyi kwesiriri ime kwa mgbe o bula bu ihe ndi Nineve

mere, nke bu, dika anyi na-aguta na Jona 3:9:

Onye maara? eleghi anya Chineke ga-echighari, chegharia uche, si

n’iwe Ya di oku chigharia, ka anyi we ghara ila n’iyi.

Anyi agaghi eche na ihe o bula anyi mere ma o bu ihe nke

anyi na-eme ga-ebute ma o bu nye anyi nzoputa

24
Ya mere, anyi agaghi eche na ihe o bula anyi mere ma o bu

ihe nke anyi na-eme ga-ebute ma o bu nye anyi nzoputa. Nke a bu

eziokwu, ma anyi ekwere na o bu Chineke na-aru oru n’ime ndu anyi

ime ihe O na-acho ma o bukwanu na anyi na-agbali irube isi n’ihi na

ako na uche anyi na-ama anyi ikpe.

Ekpere nke onye a na-azoputaghi na-ario aririo kwesiriri ibu,

“O, Chineke, mere m ebere. Etosighi m inwete nzoputa. Ana m enye

ekele na dika m na-agbasi mbo ike n’ime ihe I na-acho, amara m na o

bu nani Chineke puru ime ka m tozuo oke ka m we jiri obi m nile na

nkpuru obi m nile na-acho Chineke, nke a puru idikwa otu a nani

mgbe e nyegoro m obi ohuru, ya bu, mgbe Chineke zoputagoro m.”

Ihe atu nke onye ona utu na Luk 18:13 kwesiri idi anyi

n’uche. N’ebe ahu anyi na-aguta:

Ma onye ona utu ahu guzoro n’ebe di anya, o choghikwa iweli

obuna anya ya lee eluigwe, kama o na-eti aka n’obi ya, si, Chineke,

ka obi Gi juru n’ebe mu, bu onye nmehie, no.

O kwesiri ka anyi cheta nkpuru okwu ndi ahu Chineke naekwu

na Joel 2:12 ruo 14:

Ma obuna ugbu a, (o bu ihe si n’onu Jehova puta), werenu obi unu

nile, werekwa obubu onu, werekwa ikwa akwa, werekwa iti aka

n’obi, chigharikute M: dowakwanu obi unu, adowakwala uwe unu,

chigharikute Jehova, bu Chineke unu: n’ihi na Onye amara na

Onye obi ebere ka O bu, Onye na-adighi ewe iwe ososo, Nke naabakwa

uba n’ebere, O na-echegharikwa uche banyere ihe ojo ahu

O ga-ewete. Onye maara? eleghi anya O ga-echighari, chegharia

uche, me ka ngozi fodu n’azu Ya; bu onyinye inata ihu oma na aja

ihe onunu inye Jehova, bu Chineke unu.

Ya mere, nke a bu uzo nke Chineke na-esite na ya na-ewete

ndi nke Ya, a kowakwara nke a ozo na Jeremaia 31: 8 ruo 9, ebe anyi

na-aguta:

Le, M gaje ime ka ha si n’ala Ugwu bia, M ga-achikoputakwa ha na

nsotu nile nke uwa, n’etiti ha ka onye isi na onye ngwuro na

nwanyi di ime na nwanyi ime na-eme ga-ano n’otu: na nkpokota

uku ka ha ga-alata n’ebe a. N’ikwa akwa ka ha ga-abia, o bukwa

n’aririo amara nile ka M ga-eduru ha: M ga-eme ka ha jerue iyi di

iche iche juputara na mmiri, n’uzo ziri ezi, nke ha na-agaghi asu

ngongo n’ime ya: n’ihi na aghoworo M Israel nna, ma Efraim.

Okpara M ka o bu.

25
Anyi apuru Inu Ihe Baibul na-ekwu mana ghara Inu Ya?

N’otutu ebe n’ime Baibul, Chineke na-enye ido aka nke di na

Jeremaia 29:17 ruo 19, ebe anyi na-aguta:

Otu a ka Jehova nke usu nile nke ndi agha siri, Le, M gaje iziga

n’etiti ha mma agha, na oke unwu, na ajo oria na-efe efe, M gaemekwa

ha ka ha dika fig jogburu onwe ha, nke a na-agaghi eri eri

, site n’ijo njo ha. M ga-ejikwa mma agha, jikwa oke unwu, jikwa

oria na-efe efe, chuso ha, M ga-ewerekwa ha nye iburu alaeze nile

nke uwa ihe ntughari, ibu ihe ogbugba iyi, na ibu ihe iju anya, na

ibu ihe ima oso, na ibu ihe ita uta, n’etiti mba nile ebe M

chugaworo ha: n’ihi na ha egeghi nti okwu M nile, (o bu ihe si

n’onu Jehova puta), nke M zigara ha ndi oru M, bu ndi amuma,

igwa ha, na-ebili n’isi ututu na-eziga ha; ma unu egeghi nti; o bu

ihe si n’onu Jehova puta.

Ige nti bu iche nti nu, iji gba mbo ghota ihe e nyere

n’iwu ma na-agbali irube isi.

Ige nti bu iche nti nu, iji gba mbo ghota ihe e nyere n’iwu ma

na-agbali irube isi. Mana, o buru na anyi were otu ahu anyi si aghota

ihe bu eziokwu we biakwute Baibul, mgbe ahu anyi agaghi ege nti nu

nke bu eziokwu, ya mere, dika amaokwu ndi a na-akowa, anyi

agaghi anu Okwu nke bu eziokwu.

Dika ima atu, onye ahu kwenyere na ihe ga-eme mmadu

n’odinihu adighi ya n’aka ma o bu na o kwere n’ezie na udi ozioma

nke ya ahu na-ekwu na mmadu puru inwetere onwe ya nzoputa bu

eziokwu, ma o bu onye ahu nke mara uma leghara iwu ndi nke

Chineke tiri anya nke na-ekwu ka anyi jisie ike buru ndi a zoputara,

onye ahu anaghi ege nti n’Okwu nke Chineke. Ozugbo o ga-aguta ihe

o bula gbasara nzoputa n’ime Baibul, n’ime uche ya o naagbagoghari

ya ma gbalia igbanwe mputara ya ka o we dabakorita

n’echiche ndi ahu o nweburu. Nyere ya, eziokwu nke di n’okwu nke

Baibul aburula nke echiche nnupu isi ya nke mmadu bibigoro.

N’ezie, o tinyela onwe ya n’ebe o na-agaghi anu Okwu nke Chineke.

N’ihi nke a, o tinyela onwe ya n’ime onodu di oke ize ndu n’ihi na

okwukwe (Kraist dika Onye nzoputa), puru ibia nani site n’inu

Okwu nke Chineke (Ndi Rom 10:17).

26
O bu eziokwu na, Chineke puru izoputa mmadu o bula,

n’agbanyeghi otu nnupu isi ha megide Chineke si di uku, obuna dika

ha jiri isi ike we ju ige nti n’Okwu nke Chineke. Mana, Baibul anaghi

enye ndi ahu juru inu Okwu nke Chineke okwu nkasi obi o bula, ya

mere, anyi kwesiri itughari uche nke oma n’ido aka na nti nke

Jeremaia 29:18 ruo 19, nke a ka guputasiri ugbu a. O di nwute na,

onye di otu a, di nnoo otu ahu e siri kowa ndi Farisi nke e kwuru

maka ya na Matiu isi nke 23.

Mana, olileanya di, omaricha olileanya, nyere ndi ahu ga-eji

obi umeala kweta na ha na-eme nmehie, ma burukwa ndi na-esi

n’echiche ndi ha nweburu na mbu chigharia, ndi na-ejisi ike irube isi

n’ihe nile di na Baibul, nakwa ndi na-ebekuru Chineke akwa maka

ebere.

Anyi na-abiakwute Baibul, anyi agaghi eji echiche

ndi mbu ahu anyi nweburu we biakwute ya, n’agbanyeghi na

ha nwere ike idicha ka ihe ziri ezi n’anya.

Ka anyi na-abiakwute Baibul, anyi agaghi eji echiche ndi mbu

ahu anyi nweburu we biakwute ya, n’agbanyeghi na ha nwere ike

idicha ka ihe ziri ezi n’anya. Anyi aghaghi ibiakwute Baibul jiri

omume na-egosi na, “Amaghi m ihe o bula. O, Chineke, I ghaghi

ikuziri m.” Dika anyi na-etinye uchu na-agbalisi ike irube isi n’iwu

ndi Chineke tiri, omume anyi ga-aburiri ibu nke na-egosi na

n’agbanyeghi na anyi etozughi inwete nzoputa, ma anyi nwere

nnukwu nchekwube na eleghi anya Chineke ga-azoputa mu onwe m,

kwa (Jona 3:9).

Jiri Otu Akuku Akwukwo nso tulekota Ya na Akuku ozo

n’Akwukwo Nso

Anyi aghaghi icheta kwa mgbe o bula otu iwu nke Baibul di

oke mkpa nke a ga-agbasoriri dika anyi na-agbali imuta ihe site na

Baibul, iwu ahu bukwa na anyi ga-eji otu akuku Akwukwo Nso

tulekota ya na akuku ozo n’Akwukwo Nso (I Ndi Korint 2:13). Ya bu,

dika anyi na-amu Baibul, anyi ga-agba mbo hu na nkpebi anyi, ha

nile n’otu n’otu, ga-adabako n’ihe nile di na Baibul.

Site n’iburu eziokwu ndi a n’uche nakwa itinye ukpuru ndi

anyi mutagoro n’ime omumu a n’oru, anyi ga-eleba anya n’amaokwu

ole na ole ndi na-ekwu kpomkwem gbasara isiokwu a bu mmadu ibu

27
onye a zoputara. Anyi ga-eji otu amaokwu a ma ama nke oma we

malite, Ndi Rom 10:13, ebe Chineke na-ekwuputa:

N’ihi na, Onye o bula nke ga-akpoku aha Onyenwe anyi, a gaazoputa

ya.

Ozugbo, okoloto mme mme ga-aputa, ya bu, anyi ga-eleziriri

anya nke oma. Irube isi n’iwu nke na-ekwu ka anyi kpokuo aha

Chineke bu oru nke anyi na-aru. Amaokwu a dicha ka o na-akuzi na

o buru na a ruo oru nke ikpoku Chineke, na o ga-ebutere anyi

nzoputa, mana nke a apughi ime eme n’ihi na Chineke ruru oru nile

iji zoputa anyi. Ya mere, anyi maara na anyi apughi ighota amaokwu

a ma o buru na anyi achotakwughi ozi ndi ozo site na Baibul.

N’ime ichotakwu ozi ndi ozo, anyi abiaruo na Jeremaia 29:11

ruo 13, ebe Chineke na-ekwu:

N’ihi na Mu onwe M maara echiche nile nke Mu onwe M na-eche

banyere unu, (o bu ihe si n’onu Jehova puta), echiche nke udo, o

bughi nke ihe ojo, inye unu odi n’iru na ntukwasi obi. Unu gaakpokukwa

M, je kpere M ekpere, M ga-egekwa unu nti. Unu gaachosikwa

M ike, we chota M, mgbe unu ji obi nile unu acho M.

Otu eziokwu ahu ka e kwuputakwara na Deuteronomi 4:29,

ebe anyi na-aguta:

Ma a si na i si n’ebe ahu cho Jehova, bu Chineke gi, i ga-achotakwa

Ya, mgbe i were obi gi nile na nkpuru obi gi nile jua ase Ya.

Chineke na-enye anyi ozi di mkpa na, ka anyi na-akpoku

Chineke ma o bu na-acho Ya maka inwete nzoputa, na anyi ga-eji obi

anyi nile cho Ya.

Mana nke ahu bu ihe na-agaghi ekwe omume n’ihi na Baibul

na-agwa anyi gbasara onodu nke obi onye ahu a na-azoputaghi. Anyi

na-aguta na Jeremaia 17:9:

Obi di aghugho karia ihe nile, ihe na-adighi ngwota ka o bukwa:

onye ga-amara ya?

Anyi na-agutakwa na Mak 7:21:

N’ihi na n’ime, bu n’obi mmadu, ka echiche nile joro njo si aputa,

ikwa iko nile, ori nile, igbu mmadu nile,

28
Tutu mmadu enwe ike iji obi ya nile kpokuo Chineke,

a ga-enyeriri ha ha obi ohuru

Ya mere, tutu mmadu enwe ike iji obi ya nile kpokuo

Chineke, a ghaghi inye ha obi ohuru, ya bu, ha agaghizi enwe obi ojo.

Nke a bukwa kpomkwem ihe Baibul na-akuzi, dika ima atu, n’Ezikiel

36:25 ruo 27, ebe Chineke na-ekwu si:

M ga-awusakwa unu mmiri di ocha, unu ewe di ocha: o bu iru aru

nile unu na arusi nile unu ka M ga-eme unu ka unu si n’ime ha di

ocha. M ga-enyekwa unu obi ohu, o bukwa muo ohu ka M gaetinye

n’ime unu: M ga-ewezugakwa obi nkume n’anu ahu unu,

nye unu obi nke bu anu ahu. Muo nke M ka M ga-etinye n’ime

unu, me ka o buru n’ukpuru M nile ka unu ga na-ejeghari, o bukwa

ikpe M nile ka unu ga-edebe, me ha.

N’amaokwu ndi a, Chineke na-akuzi n’uzo doro anya na obi

ohuru bu Chineke na-enye anyi ya. Site n’oru ebube mara oke nma

nke bu inye anyi obi ohuru, nke a na-akpokwa mmuo ohuru, O gaeme

anyi ka anyi na-eje ije na nrube isi n’ihu Ya. O bu ihe di itunanya

na, n’ime omumu a anyi na-akowa na obi ohuru ahu ma o bu muo

ohuru ahu bu nkpuru obi ohu anyi a kpolitere n’onwu, nke anyi naanata

mgbe ahu anyi na-aburu ndi a zoputara. Amaokwu ndi a di

n’Ezikiel na-akowa otu Chineke si eme anyi ndi a zoputara, o bukwa

nani Chineke na-aru oru nile nke izoputa anyi.

A na-enye Mmadu Nile Iwu ka Ha Kpokuo Chineke

Anyi na-aguta na Ndi Rom 10:13 na “onye o bula nke gaakpoku

aha Onyenwe anyi, a ga-azoputa ya,” mana anyi agaghi

ekpebi ihe nzoputa bu we ruo na anyi agunye ozi mgbakwnye ahu a

choro nke na-ekwu na anyi ga-eji obi anyi nile kpokuo Chineke iji

buru ndi a zoputara. Anyi maara na nani ikpoku Chineke agaghi

eduba na nzoputa. Anyi agaghikwa eji obi anyi nile kpokuo Ya we

ruo na Chineke azoputa anyi site n’inye anyi obi ohuru, ya bu, we

ruo na Chineke aruo oru nile di n’izoputa anyi.

Mana nke ahu na-ewebata nsogbu ozo. Ndi Rom 10:13 naekwuputa

na ndi ahu na-akpoku Chineke “ka a ga-azoputa.” Okwu

ndi a bu “ka a ga-azoputa” bu okwu ngwaa nke asusu Grik nke naegosi

na nzoputa bu ihe nke ga-eme n’odinihu nke na-abia n’ihi na

mmadu kpokuru aha Chineke. Anyi ka mutachara na nwa oge gara

aga na nghota nke Baibul gbasara akuku nke mbu nke amaokwu a bu

29
na anyi kwesiri iji obi anyi nile kpokuo Chineke. Anyi amutakwala

na anyi puru iji obi anyi nile kpokuo Ya nani n’ihi na Chineke

azoputala anyi ma nye anyi obi ohu.

Ya mere, ebe o bu na “ka a ga-azoputa” bu ihe nke ga-abia

site na anyi onwe anyi iji obi anyi nile kpokuo Chineke, anyi nwere

otu nsogbu n’ime ya. Olee otu onye ahu a zoputagoro ga-esikwa

buru onye a zoputara?

A ga-egbo nsogbu a ma anyi choputa, dika anyi mutaburu na

mbu n’ime omumu a, na nzoputa iputa ihe na ndu otu n’ime ndi

Chineke hoputara bu oru nke nwere otutu nzo ukwu n’ime ya. Nzo

ukwu nke mbu bu ihoputa onye ahu ka o buru onye a ga-azoputa.

Nzo ukwu nke abuo bu na mgbe ahu Kraist kwuru ugwo nke

Chineke choro maka nmehie nile anyi, n’otu mgbe ahu, ugwo nke

nmehie nile anyi aburula nke a kwuzuru, dika e dere n’iwu.

Nzo ukwu nke ato mere mgbe Chineke were obi ohuru ma o

bu mmuo ohuru nye ndi ahu a hoputara, bu ndi ahu Kraist nagidere

onuma nke Chineke iji kwuo ugwo nmehie ha. Nzo ukwu nke ato a

bu nke anyi na-ebukari n’uche ma anyi na-ekwu maka mmadu ibu

onye a zoputagoro.

Mana nzoputa anyi akabeghi zu oke. Anyi ka nwere ahu naeme

nmehie nke a na-aghaghi izoputa. Nke ahu na-edubatakwa anyi

na nzo ukwu nke ano, nke a ga-emekwa n’ubochi ikpeazu mgbe

Kraist ga-alaghachi ma nye ndi nile kwere ekwe n’ezie ahu ohuru ha

a kpolitere n’onwu (I Ndi Korint 15).

Ya mere, o bu ihe ziri ezi dika e siri kowa na Baibul mmadu

ikwuputa si, “anyi aburula ndi a zoputara,” ya nakwa, “a ga-azoputa

anyi.” O bu ya mere Baibul ga-eji kwuo na onye ahu a zoputagoro

“ka a ga-azoputa.” O bu ya mere anyi ji aguta, dika ima atu, na I Pita

1:5:

Ndi e were ike nke Chineke na-eche nche site n’okwukwe ruo

nzoputa nke e doziworo ikpughe n’oge ikpeazu.

O bukwa ya mere anyi ji aguta na Mak 13:13:

Mmadu nile ga-akpokwa unu asi n’ihi aha M: ma onye were ntachi

obi nogide ruo ogwugwu ihe nile, onye ahu ka a ga-azoputa.

O bu nani n’isi njedebe oge, mgbe Chineke ga-enye anyi ahu

a kpolitere n’onwu nke di ebube, ka anyi ga-aburuzi ndi a zoputara

n’akuku o bula nke odidi anyi.

30
Anyi na-enwegide ntachi obi ruo ogwugwu n’ihi na anyi aburula ndi

a zoputara. Mana o bu nani n’oge isi njedebe uwa, mgbe Chineke gaenye

anyi ahu a kpolitere n’onwu dikwa ebube, ka anyi ga-abuzi ndi

a zoputara n’akuku o bula nke odidi anyi.

Ya mere, anyi na-amuta site n’amaokwu a na o buru na anyi

agbasoghi ntuziaka nke Baibul nyere ka anyi jiri ihe ime mmuo

tunyere ihe ime mmuo, o ga-adi mfe anyi idaba n’onya nke gaemechi

anyi anya ka anyi ghara ihu eziokwu nke Baibul. Ya mere,

anyi agaghi ekpebi na ihe di otu a ma o bu otu ozo we ruo na anyi

elebachala anya na Baibul n’ozuzu ya.

Ka o di ugbu a anyi amutala otutu eziokwu ndi di oke mkpa.

Ufodu n’ime ha bu ndi a.

1. Kraist naani, aruola oru nile nke a choro iji zoputa mmadu.

2. Mgbe o bula anyi ga-erube isi n’iwu o bula, anyi na-aru oru

nke ime mmuo. Obuna mgbe a na-akabeghi zoputa mmadu, o puru,

irutu oru ime mmuo, dika ikwere na Kraist, mana oru nke a apughi

ibute nzoputa ya ma o bu nyere onye ahu aka n’iburu onye a

zoputara.

Ebe anyi mutagoro ukpuru ndi a, a na-ado anyi aka na nti na

n’agbanyeghi na amaokwu nke di n’ime Baibul nwere ike idicha ka o

na-akuzi na nzoputa anyi ga-abia site na anyi onwe anyi ikwere ma o

bu rube isi n’iwu ndi di na Baibul, ozugbo ahu anyi ga-amara na nke

ahu bu nghota ezighi ezi nke amaokwu ahu. Anyi maara na anyi

aghaghi ime nchoghari n’Akwukwo Nso ma kpe ekpere maka inwete

amamihe ka anyi we nwe ike ighota amaokwu ahu n’uzo o kwesiri.

Oru Nke Ikwere

A na-ekwu okwu banyere nzoputa, eleghi anya okwu nke

kachasi di mkpa nke a ga-aghotariri n’uzo ziri ezi bu okwu a bu

“kwere.” Dika anyi mutagoro, “kwere” bu okwu ngwaa nyere okwu

nke ozo bu “okwukwe.” Anyi amutakwala na okwukwe bu oru, ya

mere , “ikwere” bu oru nke ime mmuo. Anyi mutakwara na o

nweghi oru o bula anyi puru iru nke puru iwete ma o bu nyere aka

n’inye anyi nzoputa.

Mmadu, o burugodu na a zoputaghi ya, o puru iru oru nke

ikwere n’ihe n’ihi na o nwere ako na uche, e dekwara iwu nke

Chineke n’obi ya. N’eziokwu, ka mmadu na-etinye uchu n’igba mbo

we baa n’Alaeze nke Chineke, ya bu, iburu onye a zoputara, o gaerube

isi n’iwu ahu n’ihi na o nwere ike nke ikwere n’ihe n’ime ya.

31
Mana udi nkwenye ahu abughi udi nkwenye nke e ji mara nzoputa.

Chineke na-akowa na ndi a zoputagoro na-esite n’obi ha ekwere na

Ndi Rom 10:9 ruo 10, ebe anyi na-aguta:

Na o buru na i ga-ewere onu gi kwuputa Jisus na O bu Onyenwe

anyi, o burukwa na i ga-ewere obi gi kwere na Chineke mere ka O

si na ndi nwuru anwu bilie, a ga-azoputa gi: n’ihi na a na-eji obi

kwere rue ezi omume, a na-ejikwa onu kwuputa rue nzoputa.

Mana, anyi mutara na obi mmadu joro oke njo (Jeremaia 17:9,

Matiu 15:19). Ya mere, o bu ihe na-agaghi ekwe omume anyi isite

n’obi anyi kwere we ruo na Chineke enye anyi obi ohuru. Mgbe

Chineke ga-enyekwa anyi obi ohu, ihe nke a putara bu na O zoputala

anyi (Ezikiel 36:24 ruo 27). Ya mere, mgbe ahu anyi na-ekwere tutu a

zoputa anyi, o siteghi n’obi, ya mere o nweghi ihe jikoro nke ahu na

nzoputa.

N’aka nke ozo, o buru na anyi jiri obi anyi nile kwere, o

putara na Chineke a zoputala anyi site n’inye anyi obi ohu. Nkwenye

nke anyi n’ozuzu ya bu nke putara ihe site n’ihi na Chineke

azoputala anyi. Ya mere, okwu a bu “ikwere” nakwa nkejiokwu a bu

“inwe okwukwe” o nweghi ma oli ka a huta ha ka uzo ma o bu ngwa

oru nke anyi ga-esite na ha buru ndi a zoputara.

Anyi na-aguta n’Olu ndi ozi 8:13 ruo 23, na Saimon onye

mgbasi ahu kwenyere a we mee ya baptizim, mana amaokwu ndi naesote

ya gosiri n’uzo doro anya na a zoputaghi ya. Abraham kweere

n’ihi na o bu Chineke (Kraist) guru ya nke ahu dika ezi omume.

Saimon kweere dika onye a na-azoputaghi. Abraham kweere dika

onye a zoputara. Mana, n’ime ndu Saimon nakwa n’ime ndu

Abraham, nkwenye abughi ihe nyere aka n’iwete nzoputa.

Ya mere, anyi puru ikpebi site na nke a na iru oru nke ikwere

tutu a zoputa anyi apughi inyere aka n’uzo o bula ma oli n’inye anyi

izoputa. Iru oru nke ikwere mgbe a zoputachara anyi bu nke anyi naeme

mgbe nile ma o buru na Chineke azoputala anyi.

Mmadu irube isi n’iwu e nyere ka anyi kwere bu nke na-esitere n’agu

mmadu nwereigbali we rube isi n’iwu nile nke Chineke.

Mana, okwu a bu “kwere” na-egosi uru nakwa mkpa o di

ikwere tutu a zoputa anyi. Mmadu irube isi n’iwu e nyere ka anyi

kwere bu nke na-esite n’agu mmadu nwere igbali we rube isi n’iwu

nile nke Chineke. Iwu ndi a gunuyere ihu Chineke n’anya, icho

32
nzoputa, ichere oge Ya, isi na nmehie anyi chegharia, nakwa ikpe

ekpere maka nzoputa. Irube isi n’iwu ndi a bu oru nke anyi na-aru

aru, kama o pughi idubata anyi na nzoputa ma oli. Ma ka o sina di,

udi nrube isi nke a ga-eme anyi ka anyi gee nti na Baibul karia ma

gee ya nti nke oma. Ya mere, anyi ga-ano n’onodu ibu ndi a zoputara

ma o buru na Chineke na-ezube izoputa anyi.

Olee otu anyi puru isi kwere ma o buru na anyi nwuru anwu

n’ime mmuo? Cheta, Chineke na-akowa na ndi mmadu a naazoputaghi

dika ndagwurugwu nke okpukpu kporo nku (Ezikiel 37)

ma dikwa ka ozu na-esi isi (Jon 11:39). Chineke na-ekwuputa na o

nweghi onye o bula na-acho Chineke, o nweghi, obuna otu (Ndi Rom

3). Okwu ndi a na-akowaputa ka o doo anya na n’ezie tutu nzoputa

abia, mmadu o bula nwuru anwu n’ime mmuo. N’ahu nakwa na

nkpuru obi o nwuru anwu n’ime mmuo, Chineke ebighikwa n’ime

ya. N’ihi nmehie ya, dika iwu si mebe ya, onuma nke Chineke di

n’ebe o no, o nokwa n’uzo ga-eduba ya na mbibi.

Nmehie o bula n’otu n’otu na-ebute ugwo nke bu mbibi, ya

mere, o buru na Chineke etinyeghi aka n’ime ya, onye o bula gaaburiri

onye e bibiri. N’agbanyeghi na iwu nke Chineke, ditu n’ime

mmadu, nakwa na o nwere ako na uche nke mere na o maara ihe ziri

ezi na ihe ezighi ezi, n’agbanyeghi ya, o buru na enyemaka esiteghi

na Chineke biara ya, onodu ya bu nke ga-adi oke njo. Ya mere, ka

onye a na-azoputaghi na-aru oru nke ikwere na Kraist, ya onwe ya ka

bu ozu na-esi isi, ndagwurugwu okpukpu kporo nku. O pughi iji obi

ya nile cho Chineke ma o bu jiri obi ya nile kwere n’ihi na obi ya joro

oke njo. Nani ma o buru na Chineke enye ya obi ohu, ya bu, mgbe

Chineke ga-azoputa ya, ka o ga-achowazi Chineke ma jiri obi ya nile

kwere na Chineke. Mgbe a ga-enye ya obi ohuru, n’ime nkpuru obi

ya n’ime mmuo ya, o burula onye ga-adi ndu ruo mgbe ebighi ebi.

A na-enye Mmadu Nile Iwu ka ha Kwere Chineke

Anyi na-aguta n’Olu ndi ozi 16:31:

Ha we si, Kwere n’Onyenwe anyi Jisus, a ga-azoputa kwa gi, gi

onwe gi na ezinulo gi.

Anyi maara na nani ikwere n’ime obi anyi metutara nzoputa.

Mgbe anyi ga-ekwerekwa n’ime obi anyi, anyi aburula ndi a

zoputagoro n’ihi na Chineke aghaghi inyegodu anyi obi ohuru ka

anyi we kwere n’ime obi anyi (Ezikiel 36:26). Obi ohuru na-egosiputa

na anyi aburula ndi a zoputara.

33
Anyi na-aguta nkpuruokwu ndi ahu a ma ama na Jon 3:16:

N’ihi na Chineke huru uwa n’anya otu a, na O nyere obuna Okpara

O muru nani Ya, ka onye o bula nke kwere na ya we ghara ila n’iyi,

kama ka o nwe ndu ebighi ebi.

Ugbu a, anyi maara na okwu a bu “onye o bula” puru igunye

nani ndi ahu Chineke hoputara. Anyi makwara na onye ahu a naazoputaghi,

onye Chineke na-ezubeghidi izoputa puru ikwenyetu na

Ya. Anyi makwara na ndi ahu a na-azoputa na a naghi azoputa ha

n’ihi na ha ruru oru nke ikwere na Kraist. Nke bu eziowku bu na ha

kweere na Ya n’ihi na Chineke enyela ha ndu ebighi ebi. Nkwenye ha

na-aputa ihe n’ihi na n’ezie Chineke azoputala ha.

Nke bu eziowku bu na ha kweere na Ya n’ihi na

Chineke enyela ha ndu ebighi ebi.

Kraist Ruru Oru Nile Ahu- Kwudosiri ike n’Okwukwe-iji Zoputa

Anyi

Dika o bu na Chineke dere Baibul, O meghi ya ka o di mfe

ichota eziokwu. O na-eme anyi ka anyi nwe nnukwu obi umeala dika

O na-eme anyi ka anyi jiri ndidi nakwa idi uchu we nyocha

amaokwu ndi a rara ahu ma na-ariokwa Chineke amamihe kwa

mgbe o bula. Anyi kwesiri icheta kwa mgbe o bula na, we ruo na

anyi ahu ndabakorita n’ihe nile Baibul na-akuzi, e wezuga nke a anyi

akabeghi ghota amaokwu ahu anyi na-amu.

Otu ihe mgbaghoju anya nke Baibul na-eweputa bu nke ahu a

ga-ahu n’ime otutu amaokwu di na Ndi Galetia 2 nakwa Ndi Galetia

3. Dika ima atu, Chineke na-ekwusi ya ike na Ndi Galetia 3:2:

Nani nke a ka m na-acho imata n’onu unu, Unu sitere n’oru di iche

iche nke iwu nata Muo Nso [unu aburu ndi a zoputara], ma o bu na

unu sitere n’onunu nke okwukwe nata Ya?

Cheta na okwukwe bu oru. Mana onye ruru oru nile di

n’izoputa anyi? Jisos ruru oru nile ahu. O kwudosiri ike n’iwu nile

nke Chineke tiri, O wetekwara anyi nzoputa. Ya mere, anyi puru

isughari ihe e dere na ndi Galetia 3:2, n’uzo di otu a, “Unu sitere

n’oru di iche iche nke iwu nata Muo Nso ma o bu unu sitere n’onunu

nke okwukwe nata ya (oru nke Jisos ruru iji zoputa anyi)? O bu ya

34
mere aha Ya ji buru Onye kwesiri ntukwasi obi (Nkpughe 19:11). O

bu Ya onwe Ya kachasi mkpa n’ime oru nke okwukwe ahu.

Ndi Galetia 2:16, na-ekwuputa:

Ma ebe anyi matara na a gughi mmadu n’onye ezi omume site

n’oru di iche iche nke iwu, ma o bu nani okwukwe e kwere na Jisus

Kraist ka e ji gu mmadu n’onye ezi omume, obuna anyi onwe anyi

kweere na Kraist Jisus, ka e we gua anyi na ndi ezi omume site

n’okwukwe anyi kweere na Kraist, O bughikwa site n’oru di iche

iche nke iwu: n’ihi na site n’oru di iche iche nke iwu o dighi anu

aru o bula, bu mmadu, a ga-agu n’onye ezi omume.

A naghi agu mmadu n’onye ezi omume site n’oru di iche iche

nke iwu kama o bu site n’okwukwe, bu oru nke Kraist Jisos. O

kwudosiri ike n’iruzu oru nile a choro maka nzoputa anyi.

Kwa mgbe, kwa mgbe, o na-adiri anyi mfe karia ighota

amaokwu ndi ahu nwere okwu a bu “okwukwe” n’ime ha ma o buru

na anyi were okwu ozo dochie anya okwu a bu “Kraist” onye aha Ya

bu “Onye nwere okwukwe.” Ya mere, Ndi Efesos 2:8, ka a puru

ighota n’uzo di otu a, “O bu amara ka e jiworo zoputa unu, site

n’okwukwe (Kraist).” Ya nakwa Ndi Galetia 3:11, n’uzo di otu a,

“Onye ezi omume ga-esite n’okwukwe (Kraist) di ndu.” Nakwa Ndi

Galetia 3:2, ka a ga-aghota n’uzo di otu a, “Unu esitere n’oru di iche

iche nke iwu nata Muo Nso, ma o bu na unu sitere n’onunu nke

okwukwe nata Ya (ma o bu inu ihe gbasara Kraist, bu Okwu nke

Chineke?”

Oru Nke Ikachite Ihe Akara Bu Oru Nke Chineke Mgbe Nile

Otu nkuzi nke Baibul a na-akuzi n’uzo na-ezighi ezi bu nke

ndi oka mmuta Tioloji nakwa ndi uka ndi ozo na-akuzi bu ndi ahu

na-ekwu na baptizim ga-akachite mmadu akara ba n’ime ogbugba

ndu ahu ma o bu n’ime ezi omume.

Ha weputara nkuzi nke a na-ezighi ezi site n’idabere na Ndi

Rom 4:11, ebe anyi na-aguta:

O we nara ihe iriba ama nke bu obibi ugwu, bu akara nke ezi

omume nke okwukwe ahu nke di n’ebighi ugwu ya: ka o we buru

nna nke ndi nile kwere, o bu n’ezie na ha no n’ebighi ugwu, ka e

we gua ezi omume nye ha;

35
Oru nke ika ihe akara bu oru nke iwu kwadoro nke nani

Chineke na-aru ya. Dika ima atu, Chineke na-akowa nzoputa nke otu

n’ime ndi O hoputara na Ndi Efesos 1:13, ebe anyi na-aguta:

Onye unu onwe unu nokwa n’ime Ya, mgbe unu nuru okwu nke

eziokwu ahu, bu ozioma nke nzoputa unu, o bukwa n’ime Ya,

mgbe unu kwekwara na Ya, ka e ji Muo Nso nke nkwa ahu ka unu

akara,

N’amaokwu a, Chineke na-ekwu na ha nuru Okwu nke

Chineke (okwukwe si n’onunu puta), ha malitere itukwasi Baibul obi,

ha kweere (Jona 3:5), n’ihi na ha bukwa ndi nke Chineke hoputara

nakwa na Chineke akwubuolari ugwo maka nmehie nile ha, Chineke

kaziri ha akara site n’inye ha Muo Nso, nke bu ihe na-egosi

n’eziokwu na Chineke azoputala ha. Ya mere, Chineke na-akuziri

anyi na ikachi akara bu nke a ga-ahuta dika oru nke Chineke inye

mmadu nkpuru obi ohuru.

Ya mere, anyi ga-aghotariri na Ndi Rom 4:11 na-akuzi ihe ndi

a:

O we nara ihe iriba ama [oru ebube] nke bu obibi ugwu [obibi

ugwu nke ime mmuo, nke bu nzoputa (Deuteronomi 30:6], bu akara

[ihe akaebe na-egosi n’ezie] nke ezi omume nke okwukwe [Kraist]

di n’ebighi ugwu ya [obibi ugwu nke anu ahu]: . . .

Site n’ighota ya n’uzo di otu a, anyi ga-amata na o

dabakoritara n’ihe nile Baibul na-akuzi gbasara nzoputa.

Oge Ufodu, A ghaghi Idezighari Ntughari Asusu Ahu

Anyi na-enwekari ntukwasi obi na ndi oru ntughari asusu

ahu weputara Baibul nke King Jemes, bu ya bu ntughari Baibul ndi

mmadu kachasi tukwasi obi n’ime ntughari nile di iche iche e nwere,

na ha ruru oru dabara nke oma n’itughari asusu ndi mbu mbu ahu

bu Hibru na Grik ka o di n’asusu Bekee. Mana, ha emeghi nke a site

n’ike nke Chineke dika ndikom ndi nso nke Chineke, bu ndi ode

akwukwo, ndi deputaburu Baibul nke mbu mbu site n’onu nke

Chineke, ya mere ndi oru ntughari asusu a ga-abu na ha mere ndehie

n’ufodu ebe. Anyi lezie anya nke oma we muo ufodu amaokwu ndi

metutara mmadu ibu onye a zoputara, anyi na-ahu na, n’ezie, a gaedezighariri

ntughari asusu ndi ahu ha mere. Cheta, a ghaghi ime

ndezighari na ntughari asusu ndi ahu ha mere, kama a gaghi eme

nke a n’asusu ndi mbu mbu ahu bu Hibru ma o bu Grik.

36
Nke bu eziokwu bu na, dika o bu na anyi na-agba mbo ime

ka ihe nile e dere n’Akwukwo Nso dabakorita, a na-eweputa otu

nsogbu buru ibu nke di n’oru ntughari asusu nke e mere na Baibul.

Ihe a na-ahukari bu na, ndi oru ntughari asusu nke Baibul, o kachasi

ndi tughariputara Baibul nke King Jemes, bu ndi ruru nnoo oru

dabara adaba dika o bu na ha gbaliri nke oma ikwudosi ike n’ihe e

dere n’asusu mbu mbu nke Hibru nke Akwukwo Nso Agba Ochie ya

nakwa ihe e dere na asusu Grik nke Akwukwo Nso Agba ohu.

Mana, e nwere ufodu amaokwu di n’ime Baibul ndi dicha ka ha

adabakoritara onu n’uzo zuru oke n’otu ahu e siri tugharia ha, mana

n’ezie, ha ebutela nnukwu ihe odachi n’ihe gbasara ozi nzoputa nke

Chineke. Ihe ndi a bu ihe gbasara ihe ozizi ahu nke na-akowa otu

mmadu ikwere si metuta onye ahu iburu onye a zoputara. Biko, lee

anya choputa nkweko nke di n’etiti amaokwu ndi a na-esote.

Jenesis 15:6: O we kwere na Jehova; O we gua ya nye ya n’ezi

omume.

Ndi Rom 4:3: N’ihi na o bu gini ka ihe e deworo n’akwukwo nso

na-ekwu? Abraham we kwere Chineke, e we gua nke ahu nye ya

dika ezi omume.

Ndi Rom 4:9: O bukwa ndi obibi ugwu ka a na-akpo ndi ngozi a

diri, ma o bukwa ndi ebighi ugwu? n’ihi na anyi na-asi, A guru

okwukwe Abraham nye ya dika ezi omume.

Ndi Galetia 3:6: Dika Abraham kweere Chineke, e we gua nke ahu

nye ya n'ezi omume.

Amaokwu ndi a dicha nnoo ka ha na-akuzi n’uzo putara ihe

na nzoputa ga-abiara mmadu site na onye ahu ikwere na Jisos dika

Onye nzoputa ya, udi nkuzi nke a bukwa isi ntoala nke ihe ozizi nke

a na-akuzi dika atumatu nzoputa nke Chineke n’ime uka nile nakwa

ekpemkpe uka nile.

Oge o bula anyi rubere isi n’iwu o bula di na Baibul,

nke gunyere iwu e nyere ka anyi kwere na Kraist, nke ahu bu

oru nke anyi na-aru aru.

Mana udi mkpebi ahu bu nke na-apughi ime eme. Ikwere na

Kraist bu oru nke anyi na-aru. Cheta, oge bula anyi rubere isi n’iwu o

37
ula di na Baibul, nke gunyere iwu e nyere ka anyi kwere na Kraist,

nke ahu bu oru nke anyi na-aru aru. Dika anyi mutagokwara, oru

nile di n’izoputa mmadu bu nke Kraist rubugoro. N’ihi nke a, o

nweghi oru o bula anyi puru iru nke ga-ebute ma o bu nyere aka

n’udi o bula iji nwetere anyi nzoputa. Ikwere bu inwe okwukwe,

Baibul na-ekwukwa n’uzo doro anya na okwukwe bu oru.

Anyi na-aguta na I Ndi Tesalonaika 1:3:

Ebe anyi na-echeta na-ewepughi aka oru nke okwukwe unu na

ndogbu n’oru nke ihunanya unu na ntachi obi nke olileanya unu ji

ele anya Onyenwe anyi Jisos Kraist, n’ihu Chineke anyi, bu Nna

anyi;

Anyi na-agutakwa na II Ndi Tesalonaika 1:11:

O bukwa nke a ka anyi ji na-ekpe ekpere banyere unu mgbe nile,

ka Chineke anyi we gua unu na ndi kwesiri okpukpo a kporo unu,

ka O werekwa ike mezuo ihe nile o bula nke diri idi nma ezi nma

na oru nile o bula nke okwukwe;

Mmadi ikpebi na nani ikwere na Kraist ga-ebute

nzoputa bu nke na-apughi ime eme ma oli.

Ya mere, mmadu ikpebi na nani ikwere na Kraist ga-ebute

nzoputa bu ihe na-apughi ime eme ma oli. O di nwute, nkuzi nke ahu

na-ekwu na ikwere ga-enyeriri aka na nzoputa anyi bu nke naeweputa

udi atumatu nzoputa nke di nnoo ka oru nke nwoke ahu e

dere maka ya n’Onu Ogugu 15 bu onye chikotara ufodu nku osisi

n’ubochi nke asaa nke izu ike, ya mere, dika Chineke nyere n’iwu, e

jiri nkume tugbuo ya. Cheta, izu ike nke ubochi asaa, nke a na-agaghi

aru oru n’udi o bula n’ime ya, bu ihe onyonyo na-egosi ukpuru ahu

nke bu na anyi agaghi anwa anwa che na oru o bula anyi na-aru puru

inyere aka n’udi o bula n’ime ka anyi buru ndi a zoputara.

Ozugbo, anyi ga-ahu oke ihe ogbatuhie nke putagoro ihe

n’ime nzuko uka o bula. Ha na-akuzi udi atumatu nzoputa nke naetinye

onye o bula nke na-eche na a zoputala ya n’ihi na o malitere

ikwere na kraist n’otu udi onodu ahu dika nwoke ahu chikotara

ufodu nku osisi n’ubochi nke asaa nke izu ike. Onye di otu a, onuma

nke Chineke ka di n’ebe o no. Nke a bu nnoo onodu jogburu onwe.

38
Oleezi, otu o tosiri ka e sibuo tugharia amaokwu ndi a? Anyi

ga-eleba anya na ha nile n’otu n’otu ma buru otu eziokwu n’uche nke

bu na ikwere n’ihe bu oru.

Abraham O Kweere Chineke a we Zoputa ya n’ihi nke a?

Na mbu, anyi ga-ele anya na Jenesis 15:6. Na Baibul nke King

Jemes, o bu otu a ka e si tugharia ya:

O we kwere na Jehova; O we gua ya nye ya n’ezi omume.

Amaokwu a dicha ka o na-agwa anyi n’ezie na okwukwe nke

Abraham ka a guru nye ya n’ezi omume; ya bu, n’ihi na o kweere,

Chineke zoputara ya.

Ikwere bu oru nke anyi na-aru, oru nke anyi

apughikwa isonye na nzoputa anyi.

Mana dika anyi mutagoro, udi nkwenye ahu agaghi ekwe

omume n’ihi na ikwere bu oru nke anyi na-aru, oru nke anyi

apughikwa isonye na nzoputa anyi. Onodu ihe amaokwu a na-akowa

na-agwa anyi na nkwenye nke Abraham bu nkwenye nke onye a

zoputagoro. Anyi aghaghi icheta na mgbe Chineke ga-azoputa anyi,

anyi ga-aru ezi oru, mana o nweghidi ka ezi oru ndi a, nke gunyere

ikwere, si nyere anyi aka n’ibu ndi a zoputara. Kwa mgbe o bula, ha

bu oru nke onye ahu na-aru n’ihi na a zoputala onye ahu.

Anyi kwesiri imata na, n’asusu Hibru, njiko okwu bu “e we”

bu nke a na-atughari oge ufodu kpo ya “maka.” Ya mere, n’amaokwu

a, njiko okwu a bu “e we” kwesiburu ka a tugharia ya kpo ya

“maka.”

Nsogbu nke abuo bu n’ighota okwu nnochi aha a bu “ya.”

Okwu nnochiaha nke a bu “ya” ka a tughariri n’uzo dabara adaba,

mana olee ihe o na-arutu aka na ya? Okwu nnochiaha a bu “ya” o

na-arutu aka n’okwukwe nke Abraham? O bughi ya ma oli, o bu n’ihi

uzo ihe abuo buru ibu. Nke mbu bu na a pughi igu okwukwe nke

Abraham n’ezi omume.

Ihe nke abuo buru ibu mere ya bu na n’onodu ihe a na-akowa

ebe a okwu nnochi aha nke a bu “ya” bu okwu nkpolu na-egosi ihe di

nani otu. Ya bu, o na-arutu aka n’okwu nke na-egosi ihe di n’udi

nwunye. Okwu a bu “okwukwe” bu okwu na-egosi oke. Ya mere,

39
okwu nnochiaha nke a agaghi abu okwukwe nke Abraham ka o naarutu

aka na ya.

N’aka nke ozo, okwu a bu “ezi omume” bu okwu di n’udi

nwunye, o dabakwara nke oma n’uzo zuru oke n’amaokwu a. N’ihi

nke a, anyi kwesiziri ighota Jenesis 15:6, na ihe o na-ekwu bu:

O [Abraham] we kwere na Jehova; maka na (o bughi “O we”) O

[Chineke] guru ya [ezi omume nke Chineke] nye ya [Abraham] n’ezi

omume [nzoputa nke Abraham].

N’otu aka ahu, na Ndi Rom 4:3 Ndi Galetia 3:6, nakwa Jemes

2:23, otu e siri tugharia ya na Baibul nke King Jemes bu, “Abraham

we kwere na Chineke, e we guo ya nye ya n’ezi omume.” N’otu a e

si tugharia ya, amaokwu ndi a dicha ka ha na-akuzi na okwukwe nke

Abraham bu ya bu ihe butere ma o bu na o bu ya bu uzo ma o bu

ngwa oru Chineke sitere na ya we zoputa ya. Mana, dika anyi

kwugoro ugboro ugboro, nke a agaghi ekwe omume. Ya mere, anyi

aghaghi igba mbo hu na a tughariri amaokwu ndi a n’uzo kwesiri

ekwesi.

O nwere nkpuru okwu abuo n’ime ntughari ndi a nke e

kwesiri idezighari ka amaokwu a we dabakorita n’usoro iwu ahu

sitere na Baibul nke bu na Chineke ruru oru nile nke izoputa.

Ozokwa, okwu mbu nke e tosiri igbanwe bu njiko okwu a bu “a we.”

E kwesiri ituaghari ya ka o buru okwu a bu “maka.” Obuna dika o

siri di n’asusu Hibru, okwu Grik nke a tughariri kpo ya “a we”

bukwa nke a na-atughari oge ufodu kpo ya okwu a bu “maka.”

Okwu nke abuo nke kwesiri ka e dezigharia ya bu okwu

nnochiaha nke a tughariri kpo ya “ya.” Dika asusu ahu si di, o bu

okwu nke na-egosi onye nke ato. N’onodu a na-ekwu maka ya ebe a

“ya” kwesiri ka a tugharia ya kpo ya “Abraham.” Ya mere, iji

kowakwa ya ozo ka o doo anya, ndi Rom 4:3, Ndi Galetia 3:6, nakwa

Jemes 2:23 kwesiri ka a tugharia ha otu a, “Abraham kweere na

Chineke (o buuru onye a zoputara), maka na a guru Ya (Chineke) nye

ya (Abraham) n’ezi omume (na nzoputa nke Abraham).”

Anyi kwere Kraist, O puru Izoputa Anyi

Ugbu a anyi mutagoro na oru nile nke nzoputa bu nke Jisos

Onye nzoputa anyi rubugoro, nakwa na anyi agaghi anwa anwa

kwere na oru o bula nke anyi na-aru puru itinye obuna utu dikarisiri

nta na nzoputa anyi, anyi puru ighotazi ufodu amaokwu nke oma,

bu ndi dicha ka ha na-akuzi ihe ozo di iche.

40
Dika ima atu, na Ndi Galetia 2:16, Chineke na-ekwuputa:

Ma ebe anyi matara na a gughi mmadu n’onye ezi omume site

n’oru di iche iche nke iwu, ma o bu nani okwukwe e kwere na Jisus

Kraist ka e ji gu mmadu n’onye ezi omume, obuna anyi onwe anyi

kwere na Kraist Jisus, ka e we gua anyi na ndi ezi omume site

n’okwukwe anyi kwere na Kraist Jisus, o bughikwa site n’oru di

iche iche nke iwu: n’ihi na site n’oru di iche iche nke iwu o dighi

anu ahu o bula, bu mmadu, a ga-agu n’onye ezi omume.

Akuku mbu nke amaokwu a doro anya nke oma. A naghi

azoputa anyi site n’ihi na anyi na-erube isi n’iwu o bula di na Baibul

(ya bu, idebe iwu), kama o bu site n’okwukwe (oru nke okwukwe),

nke Jisus ruru iji zoputa ndi nke O hoputara.

Mana akuku nke abuo n’amaokwu a bu nke di mfe mmadu

ighotahie ya n’uzo ezighi ezi. O dichasi ka o na-akuzi na o buru na

anyi ekwerela na Kraist, Chineke ga-aguzi anyi na ndi ezi omume

(zoputa anyi). Udi nghotahie nke a puru ibata, n’agbanyeghi na

Chineke na-ekwuputa n’akuku ikpeazu nke amaokwu a, “site n’oru

di iche iche nke iwu o dighi anu ahu o bula, bu mmadu, a ga-agu

n’onye ezi omume.” Ikwere bukwa oru nke iwu.

Ebe o bu na ikwere bu oru nke iwu, oleezi otu anyi ga-esi

ghota “obuna anyi onwe anyi kweere na Kraist Jisus, ka e we gua

anyi na ndi ezi omume”? N’asusu Grik, okwu ndi a bu “ka aga-agu

n’onye ezi omume” di n’udi na-egosi ihe a na-atu anya na o nwere

ike eme eme. N’asusu Grik a puru iji udi ngwaa nke a na-egosi ihe

nwere ike eme eme n’otu uzo ahu e sikwa eji ya ekwu okwu n’asusu

Bekee. O na-egosi ihe e bu n’uche na o nwere ike ime eme n’ezie.

Otutu ngwa di n’udi na-egosi ihe nwere ike ime eme di n’asusu Grik

nke Baibul ka a na-ejikwa ekwu okwu n’uzo di otu a.

Mana, n’asusu Grik, a na-ejikwa ha egosi nzube ma o bu

okwu ntimiwu. Dika ima atu, udi ngwaa nke a ka a na-ejikari n’ime

Akwukwo Nso Agba Ohu egosi na e mezuola amuma nke di

n’Akwukwo Nso Agba Ochie. Ya mere, anyi na-aguta nkpuru okwu

ndi a bu “we mezuo” (Matiu 4:14, 8:17, 12:17). Okwu ngwaa nke a bu

“we mezuo” bu ngwaa na-egosi na ihe ahu nwere ike ime eme.

N’ebe ndi a, otu e siri dee okwu ngwaa ndi a, o dighi arutu aka n’udi

na amachaghi n’ezie ma o ga-emekwa. E mezuola okwu amuma ahu.

Anyi laghachi na Ndi Galetia 2:16, anyi maara na

n’agbanyeghi na ikwere bu oru nke anyi na-aru, nkwenye anyi

apughi ime ka anyi nwe nzoputa. Nkwenye anyi puru ime anyi ka

anyi gbalia irube isi n’iwu ndi Baibul tiri anyi ka anyi buru ndi a

zoputara, ka anyi na-ekpe ekpere, ka anyi chegharia, w.d.g., mana

41
anyi maara na nzoputa anyi dabere kpamkpam na Chineke, nakwa

ma O hoputala anyi ma kwuo ugwo maka nmehie nile anyi.

Nzoputa anyi dabere kpamkpam na Chineke,

nakwa ma O hoputala anyi makwuo ugwo maka nmehie nile anyi.

Ya mere okwu ngwa nke a bu “ka a ga-agu n’onye ezi

omume” nke na-egosi ihe nwere ike ime eme, ka a ga-aghotariri

n’udi na ihe o putara bu na igu mmadu n’onye ezi omume (nzoputa)

bu ihe puru ime eme, mana o bughi iwu na o ga-abiara ndi ahu naaru

oru nke ikwere na Ya. Ndi Nineve nke Jona 3 kwere n’ezie na

Chineke gaje ibibi ha na nkpuru ubochi 40 na-abia. Ya mere, ha

rubere isi n’iwu Chineke tiri ha ka ha chegharia (Jona 3:8 ruo 10).

Mana ha ghotara n’uzo zuru oke na ha amaghikwa ma Chineke agaemere

ha ebere ka o bu na O gaghi emere ha ebere. Eleghi anya,

Chineke puru izoputa ha. O bu ihe puru ime eme na a ga-azoputa ha

puo na mbibi. Ya mere, Ndi Galetia 2:16 na-akuzi na dika anyi onwe

anyi, ya bu, dika ndi a na-azoputaghi na-ekwere n’iwu nke Chineke,

Chineke nwere ike izoputa ufodu n’ime anyi.

Cheta, otu eziokwu nke a, bu na o nweghi onye o bula puru

imata ma o bu otu n’ime ndi Chineke hoputara we ruo na a

zoputacha onye ahu, bu nke a kowaputara nke oma na Joel 2:13 ruo

14:

Dowakwanu obi unu, adowakwala uwe unu, chigharikute Jehova,

bu Chineke unu: n’ihi na Onye amara na Onye obi ebere ka O bu,

Onye na-adighi ewe iwe ososo, Nke na-abakwa uba n’ebere, O naechegharikwa

uche banyere ihe ojo ahu O ga-ewete. Onye maara?

eleghi anya O ga-echighari, chegharia uche, me ka ngozi fodu n’azu

Ya; bu onyinye inata ihu oma na aja ihe onunu inye Jehova, bu

Chineke unu.

A kowaputakwara nke a nke oma na Zefanaia 2:3

Chonu Jehova, unu nile ndi di umeala n’obi bi n’uwa, ndi luworo

ihe O kpere n’ikpe; chonu ezi omume, chonu umeala n’obi: eleghi

anya, a ga-ezobe unu n’ubochi iwe Jehova.

Otu ihe di itunanya bu na, n’amaokwu ndi a dika II Ndi

Korint 2:4 nakwa II Ndi Korint 11:7, Chineke ji okwu ngwaa nke naegosi

ihe nwere ike ime eme nke a haziri n’otu uzo ahu dika okwu

42
ngwaa nke a bu “ka a ga-agu n’onye ezi omume” na Ndi Galetia

2:16. Na II Ndi Korint 2:4, okwu ngwa ahu ka a tughaririri kpo ya “ka

o wute unu,” na II Ndi Korint 11:7, okwu ngwaa ahu ka a tughariri

kpo ya “ka e welie unu elu.” N’amaokwu abuo ndi a, onodu ihe a naakowa

na-egosi na okwu ngwaa nke a ka e tinyere iji gosi ihe nke

nwere ike ime eme, o bughi ihe nke a maragoro n’ezie na o gaemeriri.

Mgbaghoju anya di N’ighota Okwu a bu “Kwere”

Otu ihe ihe anyi na-amuta ugbu a bu na Chineke emeghi ya

ka o di mfe ma oli ighota atumatu nzoputa Ya. Chineke etinyela

okwu ngwaa nke a bu “kwere” nakwa okwu nke ozo bu “okwukwe”

n’ime amaokwu buru ibu n’onu ogu, o bukwa nani site n’ilezi anya

nke oma na-agbaso iwu ndi nke Chineke, nke bu iji ihe e dere n’otu

ebe n’Akwukwo Nso tulekota ya na ihe e dere n’ebe ozokwa

n’Akwukwo Nso, nakwa site n’icho amamihe sitere na Chineke, ka

anyi puru imalite ime ka amaokwu ndi a rara ahu dabakorita.

Chineke emeghi ya ka o di mfe ighota atumatu nzoputa Ya.

Otutu ukpuru ndi gbasatara mmadu ikwere n’ihe ma

burukwa ndi putakirisiri ihe bu ndi a na-esote.

1. Okwu ngwaa nke a bu “kwere” nakwa okwu nke ozo bu

“okwukwe” bu ndi a ga-ahutariri ka oru nke a na-aru aru. Nke a bu

n’ihi na Jisos ruru oru nile a choro iji zoputa ndi a hoputara nakwa

n’ihi na aha Ya bu “Onye kwesiri ntukwasi obi” (Nkpughe 19:11). O

bu Ya putakarisiri ihe n’oru nke okwukwe ahu.

2. Mgbe mmadu ga-ekwere, ruo ogo o bula, nkwenye ya bu

oru nke o na-aru nke na-apughi iso n’ime oru nke a choro maka

nzoputa ya. Mgbe ahu o ga-ekwere, o nwere ike buru n’ihi na ako na

uche ya na-eme ya ka o kwere ma o bu eleghi anya na Chineke naaru

oru n’ime onye ahu. Ma ka o sina di, o nweghi uzo o bula o puru

isi mara nke o bu ya n’ihi na o bu naani ma o buru na a zoputa ya, e

wezuga nke a obi ya joro oke njo, o gaghikwa eji obi ya nile kwere.

3. Mgbe mmadu ga-ekwere ma a zoputacha ya, nke ahu

bukwazi oru nke o na-aru. Mana, nkwenye ya bu obi ya nile ka o gaeji

me nke a n’ihi na mgbe ahu Chineke zoputara ya, e nyere ya obi

43
ohuru. Iji obi ya nile kwere (ibu onye a zoputara), putara na nzoputa

ya bu nke a ga-aruzu n’oge isi njedebe uwa mgbe a ga-enye ya ahu

ime mmuo ya a kpolitere n’onwu nke ga-adi ruo mgbe ebighi ebi.

Nke a di otu a n’ihi na oru nke Kraist ruru iji zoputa anyi ruzuru

nzoputa me mee n’ezie na nzoputa ga-abiara anyi n’akuku nile nke

udidi anyi. Ya mere, Baibul iji okwu ndi a bu “kwere” nakwa

“okwukwe,” dika o si metuta oru nke mmadu o bula, a gaghi ahuta

ya ma oli ka uzo ma o bu ngwa oru nke anyi ga-esite na ya wete

nzoputa ma o bu nyere aka n’ime ka anyi buru ndi a zoputara.

4. Atumatu nzoputa o bula nke na-agbasoghi usoro iwu ndi

a, n’ezie o ga-etinye onye ahu na-agbali igbaso atumatu nzoputa ahu

n’otu udi onodu ahu dika nwoke nke chikotara nku osisi n’ubochi

nke asaa nke izu ike (Onu Ogugu 15). A ga-egbu onye ahu. Nani uzo

isi zere ndu ya ibia n’isi njedebe n’uzo joro oke njo bu isi n’udi

atumatu ahu mmadu mebere we chigharia ma chere oge Chineke ka

O ruzuo oru nile nke di n’izoputa onye ahu, ma o buru, n’ezie, na

Chineke choro izoputa onye ahu.

Ekwensu Na-abia Dika Muo Ozi nke Ihe

Ugbu a anyi mutagoro, site na Baibul, ihe gbasara

ntaramahuhu jogburu onwe ya na-eso mmadu itukwasi obi n’udi

atumatu nzoputa o bula karia itukwasi obi n’atumatu nzoputa nke e

nyere na Baibul, anyi kwesiri ilezi anya nke oma n’ihe gbasara onye o

bu ya na-akuziri anyi ihe. Nke a bu ebe Ekwensu puru ibia dika muo

ozi nke ihe, ndi nje ozi ya abiakwa dika ndi nje ozi nke ezi omume (II

Ndi Korint 11:13 ruo 15).

Otutu ndi nkwusa ozioma bu ndi a na-ahuta ka ndi kwesiri

ntukwasi obi n’ihi na ha kwudosiri ike n’ikuzi ihe di na Baibul. E

nwere nnoo ntukwasi obi n’ebe ha no. Ha nwere ezi aha dika ndi nje

ozi nke Chineke. Ha na-akuzi na Baibul bu Okwu nke Chineke nke

na-adighi agha agha. Okwu nke ozioma ha bu nke a na-akuzi site

kpomkwem na Baibul. N’ihe gbasara mkpa nzoputa di nakwa

gbasara ngozi nile na-eso nzoputa, ha na-asi, “Gi onwe gi, kwa puru

ibu onye a zoputara n’abali a. Kwere na Jisos dika Okpara nke

Chineke ma nabata Ya dika Onye nzoputa gi.” Ha na-ekwuputa ihe

ndi a dika ihe agbamume n’uzo na-egosi na ha nwere ihunanya

nakwa, ma burukwa odinma mmadu ibe ha n’obi. O dicha nnoo ka e

nwere udi ihe akaebe di iche iche na-egosi na ha bu ndi nje ozi nke

Chineke n’ezie. O bu na ha anaghi ekwusa ozioma n’aha Chineke site

na Baibul?

44
Ha aburula ndi a ghogbutara ha we na-agbaso

atumatu nzoputa nke ga-ebibiriri ha n’ezie.

Atumatu nzoputa nke ha na-enye dicha nnoo mma n’anya

n’ihi na ndi mmadu na-eche na, “Mu onwe m, kwa, n’oge ugbu a,

puru imata na a gbagharala m nmehie m nile, m ga-abukwa onye gaanogide

n’ime nchedo Kraist ruo ebighi ebi.” Ya mere, ndi ahu naatukwasi

obi na ndi nkuzi Baibul di otu a ma na-esoro ntuziaka ha

na-ekwere n’ezie na ha anorola n’ime nchedo Kraist ruo mgbe ebighi

ebi. Ha aburula ndi a ghogburu aghogbu, ha we na-agbaso atumatu

nzoputa nke ga-ebibiriri ha n’ezie. Ha aburula ndi a ghogburu

aghogbu, ha we kwere n’ozioma ugha. O di nwute na, ha onwe ha

dika nwoke ahu nke chikotara ufodu nku osisi n’ubochi asaa nke izu

ike.

Na II Ndi Korint 11:14, Chineke na-ado aka na nti na

Ekwensu na-abia dika muo oma (onye nje ozi) nke ihe. Kraist bu Ya

bu onye nje ozi nke ihe n’ezie. Mana Ekwensu, site na aka ndi nje ozi

ya dicha nnoo ka Kraist. Ndi nje ozi a bucha kraist ugha, kraist naabughi

nke ezie. Ha kwenyere n’ezie na ha na-ejere Kraist ozi, mana

n’ezie, nna ukwu ha bu antikraist, bu Ekwensu.

Udi nkwusa ozioma nke ha na-ekwu, nke dikwa nnoo ka nke

otutu ndi nkuzi Baibul a ma ama, bu nke a puru ihu n’ebe nile n’uwa.

Mana n’ime ha nile, n’uzo joro oke njo ha na-ada iwu ahu nke bu na

Kraist ruru oru nile a choro iji zoputa mmadu, n’oge dikwa anya tutu

a muputa onye ahu, Kraist kwuru ugwo maka nmehie nile nke ya.

N’ezie, nke a bu ihe Baibul na-akuzi, o dikwa oke mkpa na anyi gaege

nti n’ihe nile di na Baibul ma ghota na otuto nile maka nzoputa

anyi aghaghi igara Kraist, o nweghikwa nke ga-adiri anyi.

Ndi nkwusa ozioma nke a kweere n’ezie na ha tozuru etozu,

ma burukwa ndi ozi nke Kraist kwesiri ntukwasi obi, mana nke bu

eziokwu bu na ha bu “ndi nje ozi ezi omume” nke Ekwensu (Ndi

Korint 11:15). Ha na-abia n’aha nke Jisos Kraist, mana n’ezie, ha bu

ndi nje ozi nke Ekwensu bu onye na-abia dika muo ozi nke ihe (II

Ndi Korint 11:14). N’ime atumatu nzoputa nke a ha mebere n’onwe

ha, ha na-ewete nnukwu okwu ugha n’ihi na nna ukwu ha, bu

Ekwensu, bu nna nke okwu ugha (Jon 8:44). O, nke a jogburu onwe

ya! Chetugodi echiche banyere ndi nke anyi huru n’anya na-ege ha

nti ma kwere na ha, ka ha na-anabata okwu ugha ndi a na ha bu

eziokwu, a na-ekpochi ha n’ime uzo ebe olileanya na-adighi.

45
Ya mere, biko, nke a di nnukwu mkpa. Eleghi anya, kemgbe

otutu afo gara aga i kwere na a zoputara gi n’ihi na a kuziri gi na o

buru na i “nabata” Jisos dika Onye nzoputa gi, na a zoputala gi.

Eleghi anya i jere ozi dika onye kwenyesiri ike n’otu uka gi, ya mere,

kemgbe afo ndi gara aga, i kwenyere n’ezie na i no n’udo n’aka Jisos.

Ugbu a, o buruzie oke ihe nwute nyere gi, ihu na i nokwa

n’ime otu udi onodu ahu dika nwoke ahu chikotara ufodu nku osisi

n’ubochi nke asaa nke izu ike. Onuma nke Chineke ka di n’ebe i no,

na-echezi oge a ga-ebibi gi. O di njo karia ma o buru na i buburi onye

nkuzi nke Baibul ma kuziere otutu ndi mmadu ihe, ma tinyekwa ha

n’ime otu udi onya nke atumatu nzoputa ahu mmadu mebere, we

duba ha na mbibi.

Ya mere, ajuju ndi a agaghi apu n’uche gi: “Olileanya

adikwara m? O nwere ike ibu na Chineke ga-agbaghara m nmehie m

nile ma zoputakwa mu onwe m, kwa?”

Aziza nke sitere na Baibul bu, Kraist biara maka ndi nmehie.

Gi onwe gi nwekwara otu udi olileanya ahu inwete nzoputa dika

onye o bula ozo a na-azoputaghi nwekwara. Gi onwe gi, kwa, kwesiri

isi na nmehie nke igbaso ozioma na-ezighi ezi chegharia, ma kpe

ekpere, nwe nchekwube na eleghi anya Chineke n’ebere Ya di uku

ahoputala gi inwe nzoputa.

Ihe di oke itunanya bu na, atumatu nzoputa ndi a mmadu

mebere di na nzuko o bula. Olee ihe o ji di otu a? Nsogbu bu na uka

ndi a anaghi eji ihe nile di na Baibul kporo ihe, ha anaghikwa elezi

anya nke oma we na-agbaso ntuziaka nke Baibul, nke na-ekwu ka

anyi jiri ihe di n’Akwukwo Nso tulekota ya na ihe dikwa

n’Akwukwo Nso. Ozokwa, ha aghotaghi na e dere Baibul n’asusu

nke uwa, mana anyi apughi ighota ozi buru ibu nke di na Baibul we

ruo na anyi achota nkuzi nke ime mmuo nke e nyere n’ime okwu ndi

a na-akowa ihe ndi mebugoro eme n’uwa. Ya bu, ha na-akowa ihe

ndi a e dere ede n’uzo na-ezighi ezi, bu uzo na-ezighi ezi isi tapia

Baibul (Mak 4:33 ruo 34). Mana, e nwekwara ihe ozo putara ihe mere

ozioma ugha ndi a, atumatu nzoputa ndi a na-esiteghi na Baibul ji

juputa n’ime uka di iche iche.

A Kaara Imebu ka Nzuko Uka nile digide Ocha?

Nzuko nile n’otu n’otu adabala n’ime onya, o bukwa nke a bu

ihe megoronu. Ndi na-achi nzuko ndi ahu n’ime mmuo nwere ike

buru na ha nweburu agu ziri ezi ime ka uka digide ocha, n’ihi nke a,

ha choburu inwe nani ndi mmadu a zoputagoro n’ezie dika ndi otu

uka ha. Iji nyere ha aka me nke a, uka nile ma o bu ekpemekpe nile

guzobere usoro, ma o bu atumatu ha tuburu anya isite na ya we

46
mezuo ebumnuche a. Atumatu nke a nwere ike buru ntakiri ihe dika

ikwu na onye o bula choro iba n’otu uka ha ga-eme nkwuputa nke

okwukwe, ma o bu kwuputa na o kweere na Kraist dika Onye

nzoputa ya. Mana, ndi isi nke uka kwukwara na a ga-eme onye di

otu a baptizim na mmiri ma me ya ka o kwe nkwa na dika onye so na

nzuko ahu, na o ga-akwudosi ike n’igbaso nkuzi nile nke uka ahu.

Mmebe nke ha mebere atumatu ma o bu usoro nke ha na-ekwu

na ha ga-agbasoriri iji me ka nzoputa biara mmadu, bu nke weteziri

ihe ozo megidere ihe ha na-achobu

Ma o di nwute na atumatu ndi ahu ma o bu usoro ahu ndi

uka mebere agunyeghi otu ukpuru nke Baibul di oke mkpa; ya bu,

na mgbe o bula anyi ga-erube isi n’iwu o bula Chineke tiri anyi ma

kwere na nrube isi ahu ga-enyere aka na nzoputa anyi, na anyi dika

nwoke ahu onye chikotara nku osisi ole na ole n’ubochi nke asaa nke

izu ike (Onu Ogugu 15). Na onuma nke Chineke ka di n’ebe anyi no.

Ya mere, mmebe ha mebere atumatu ma o bu usoro nke ha na-ekwu

na a ga-agbasoriri iji me ka nzoputa biara mmadu, bu nke weteziri

ihe ozo megidere ihe ha na-achobu. Nke a na-enyere aka idebegide

ndi mmadu n’ime onodu enweghi nzoputa ha.

Onodu nke a di nwute na-enyere aka igosi ihe mere na

n’ubochi anyi a, n’ime ihe foduru ntakiri ka o buru uka nile, imerime

ndi mmadu no ebe ahu anaghi ege nti n’ido aka na nti nke na-ekwu

na Ekwensu na-achizi ugbu a n’ime uka nile nakwa na ha kwesiri isi

n’uka nile gbapu ka ha we ghara ino na-ejere Ekwensu ozi n’ime

mmuo n’ebe ahu. Ha anaghikwa ege nti n’ido aka na nti a di mkpa

nke bu na isi njedebe uwa foduru ntakiri ka o ruo.

N’agbanyeghi atumatu nzoputa na-esiteghi na Baibul nke a

na-ahukari n’ime uka nile, ma mmadu ole na ole n’ime oge nke ogbo

uka buuru ndi a zoputara n’ezie. O nwere ike buru na ha nwere

ntakiri nghota ma o bukwanu nghota miri emi n’ihe gbasara nkuzi

nile nke uka ahu, mana Chineke zoputara ha n’ihi na a hoputara ha

inwe nzoputa. Ha no n’onodu inu okwu nke Baibul, Chineke

zoputakwara ha. Ya mere, ha nwere agu miri emi ma na-adigide

irube isi na nkuzi o bula nakwa nkuzi nile nke Baibul. Nke a di otu a

n’agbanyeghi na ihe ha maara na Baibul nwere ike di ntakiri.

Ndi uka nile aghotaghi na o nweghi atumatu o bula mmadu

meputara, obunagodu ma a gbasosie ya ike nke oma, puru ime ka

mmadu nwe nzoputa, odida ha kwesikwara ibu oke ihe ido aka na

nti nyere anyi. Dika a na-ezisa ozioma n’ime uwa, anyi agaghi anwa

nwa weputa atumatu mmadu mebere, we na-ekwu na o buru na a

47
gbasosie atumatu a ike nke oma, na o ga-ewetere mmadu nzoputa.

Anyi ga-akuzi na ndi mmadu a na-azoputaghi kwesiri igbali rube isi

n’iwu nile nke Chineke, ma nwe nchekwube na-ekpekwa ekpere na

eleghi anya ha onwe ha, kwa, ga-abu ndi a ga-agunye n’atumatu

nzoputa nke Chineke.

Anyi kwesiri ikuzi na ndi mmadu a na-azoputaghi kwesiri igbali rube isi

n’iwu nile nke Chineke, ma nwe olileanya na-ekpekwa ekpere na eleghi anya

ha onwe ha, kwa, ga-abu ndi a ga-agunye n’atumatu nzoputa nke Chineke.

Mgbanwe Di Uku

Ugbu a, a ghaghi ijuzi ajuju si: Olee otu nzoputa si emetuta na

ndu mmadu? Oleekwanu ihe o putara mmadu ibu onye a muru ozo?

Cheta, tutu a zoputa mmadu, n’ime akuku nile nke odidi ya o

di nnoo kpomkwem ka ndi nile a na-azoputaghi bu ndi a naagaghikwa

azoputa ma oli. N’ime ahu nakwa nkpuru obi, o ga naenwe

agu na-ezighi ezi ime nmehie ma norokwa na nnupu isi megide

Chineke.

Mana ugbu a, mgbe a ga-azoputazi ya, e nyela ya nkpuru obi

ohuru a kpolitere n’onwu. N’ime akuku nke odidi ya ahu, o burula

onye e kere eke ohu n’ime Kraist. Mgbe ahu a muru ya n’anu ahu, o

bubu nwa ohuru nke nwere ahu na nkpuru obi. N’oge nke nzoputa

ya, a muola ya ozo; ya bu a na-enye ya nkpuru obi ohuru. O bu oru

ebube nke uche mmadu nkiti anyi na-apughi ighota, o nweghikwa

ihe akaebe a na-ahu anya na-egosi mgbanwe a.

Mana, mgbanwe nke a di ebube e wetere na nkpuru obi onye

ahu ga-aputa ihe; ya bu, nkpuru obi di ohu n’ime ahu ya naagbanweghi

agbanwe ga-emetuta ndu ya n’ebe o di ukwu ma

gbanwe omume ya.

E gosiputara na nke a bu eziokwu site n’ihe Chineke

kwuputara na I Jon 3:9, ebe O na-ekwu si:

Onye o bula nke a muworo site na Chineke adighi eme nmehie,

n’ihi na nkpuru Ya na-adigide n’ime ya: o pughikwa imehie, n’ihi

na a muwo ya site na Chineke.

Chineke na-akuziri anyi na n’oge nzoputa ga-abia, mgbanwe buru oke ibu

na-aputaihe n’akparamagwa onye ahu a zoputagoro.

48
N’amoakwu a, Chineke na-akuziri anyi na n’oge nzoputa gaabia,

mgbanwe buru oke ibu na-aputa ihe n’akparamagwa onye ahu

a zoputagoro. N’ime nkpuru obi ohu ya a kpolitere n’onwu, o pughi

ime nmehie. Ebe o bu na nmehie bu mmadu ijehie n’iwu nke

Chineke, ihe o putara bu na n’ime nkpuru obi ya, o pughi ime

nmehie. Nke a putara na, n’ime nkpuru obi, o huru Chineke n’anya

ma hukwa Iwu nile nke Chineke n’anya. O putara na o na-enwe agu

di uku ma na-adigide mgbe nile irube isi n’iwu nile nke Baibul. O

putara na n’ime nkpuru obi ohu ya ahu, o burula onye di ndu n’ime

mmuo ugbu a.

Ebe o bu na Chineke emeela ihe nile iji ruzuo nzoputa onye

ahu (hoputara ya, kwuo ugwo nmehie nile ya, ma nye ya nkpuru obi

ohuru a kpolitere n’onwu, bu ihe nile di mkpa maka nzoputa nke ndi

nile a hoputara), onye ahu puru imatazi n’ezie na o nweghi ka

nzoputa ya funari ya ma oli. Nkpuru ahu nke na-adigide n’ime ya bu

Kraist (Ndi Galetia 3:16). Ozugbo ahu a zoputara ya, o na-enwe

nchekwa nke na-adi ebighi ebi. Chineke aruzuchalari ihe nile di

mkpa iji nye ya ndu ebighi ebi. N’ihi nke a, nzoputa nke onye kwere

ekwe n’ezie apughi ifunari ya. Baibul na-ekwu na o nweghi nmehie o

bula, ma o bu ihe o bula ozo, nke puru ikewapu onye kwere ekwe

n’ihunanya nke Chineke (Ndi Rom 8:35 ruo 39).

Onye A zoputara Na-ebi Ndu n’ime Ahu a na-azoputaghi

N’ime nkpuru obi ohu ya, onye kwere ekwe ka ga na-ebi

n’ime ahu ochie ya nke a na-agbanweghi ma oli n’oge ahu o nwetere

nzoputa. N’ihi nke a, o burula mmadu nwere ochicho obi di n’uzo

abuo dipuru iche n’ebe ibe ha no. N’otu aka, o ga na-acho mgbe o

bula irube isi n’iwu nke Chineke, n’aka nke ozo, o ka na-enwe agu

ime nmehie. Chineke na-akowa udi onodu a dika onye ozi Pol, site

n’ike nke Muo Nso no n’ime, kwuputara na Ndi Rom 7:21 ruo 24:

Ya mere ahuru m iwu a, na ihe ojo di m nso n’ebe aka m ga-eru,

mu, bu onye na-acho ime ihe oma. N’ihi na mu na iwu Chineke naenweko

obi uto dika mmadu ime m si di: ma ana m ahu iwu di iche

n’ihe nile di m n’ahu, na-ebu agha megide iwu nke uche m, naadotakwa

m n’agha nye iwu nke nmehie nke di n’ihe nile di m

n’ahu. Mmadu nke hujuru anya ka mu onwe m bu! onye gaadoputa

m n’ahu nke onwu a?

Ikewapu onwe anyi puo n’ahu nke na-eme nmehie bu

ochicho obi onye o bula kwere ekwe n’ezie na-enwe mgbe nile.

Mana, agha nke na-aga n’ihu n’ime onye ahu a zoputagoro abughi

49
nke kwu otu ebe. O ga na-aga aga ruo na onye ahu nwere nkpuru obi

ohu a kpolitere n’onwu ga na-ewewanyezi ike inwe nmeri na ndu ya

(II Pita 3:18). Nke a bu eziokwu n’ihi na gbakwunyere na e nyela ya

nkpuru obi ohu a kpolitere n’onwu, o nwekwara ihe ozo magburu

onwe ya nke mere n’ime onye ahu n’oge ahu e nyere ya nzoputa; ya

bu, Chineke Muo Nso amalitela ibi n’ime ndu onye ahu. Anyi naaguta

na Ndi Rom 8:9 na o buru na anyi enweghi Muo nke Chineke,

na anyi “abughi ndi nke Ya.”

Anyi aghotaghi otu Chineke Kachasi ihe nile elu puru isi biri

n’ime ndu onye a zoputara. Anyi aghaghi ikwere na o bu ihe omimi

zuru oke nyere anyi. Mana n’ihi na anyi tukwasiri Baibul obi

kpamkpam, anyi maara na o bu eziokwu putara ihe; o di omimi ma

burukwa eziokwu. Chineke n’onwe Ya ibi n’ime ndu nakwa udidi

onye ahu a zoputara ga-akpalitekwa onye ahu me ya ka o na-erubere

Chineke isi, o ga na-achokwa nani ihe ahu nke na-ato Chineke uto.

Onye ahu a zoputara aburula onye a kpoputara n’okpuru ike nke

Ekwensu, o burukwala nwa ama ala ebighi ebi nke alaeze Kraist.

Ozokwa, onye ahu a zoputara aburula onye a kpoputara

n’okpuru ike ochichi nke Ekwensu, o burukwala nwa ama ala ebighi

ebi nke alaeze Kraist. Chineke na-agwa anyi gbasara nke a na Ndi

Kolosi 1:12 ruo 13, ebe anyi na-aguta:

Na-ekele Nna anyi, Onye mere ka anyi rue iketa oke anyi n’ihe

nketa ndi nso n’ihe; Onye doputara anyi n’ike nke ochichiri, we

webiga anyi n’alaeze nke Okpara nke ihunanya Ya;

Na Ndi Filipai 3:20, anyi na-aguta na “ala anyi” di n’eluigwe.

Nke a bu eziokwu nyere onye o bula a zoputarala.

Ochicho obi nke Onye ahu A Zoputara

N’oge nke nzoputa, o nwere otutu ihe nke ga na-aru oru

n’ime ndu onye kwere ekwe nke na-ewete ngbanwe putara ihe ma

dikwa mkpa n’ime akparamagwa nakwa ochicho obi onye ahu. O gaaghota

ma mata okwu ndi ahu e kwuru dika ndi ahu a puru ihu

n’Abu Oma 119 nakwa ebe ndi ozo na Baibul.

Ndi a bucha ihe atu ole na ole na-egosi asusu mara nma nke a

ga-ahu n’Abu Oma 119 ndi na-egosiputa ihunanya nakwa nkwanye

ugwu ndi kwere ekwe n’ezie nwere n’ebe Baibul di.

50
Amaokwu 10: Obi m nile ka m wereworo cho Gi: Ekwela ka m si

n’ihe nile I nyere n’iwu jehie.

Amaokwu 16: Ihe ukpuru Gi nile ga-ato m uto nke uku: M gaghi

echezo okwu Gi.

Amaokwu 24: Ozo, ihe ama Gi nile bu ihe na-ato m uto nke uku,

Ha bu ndi na-adum odu.

Amaokwu 47: Ihe nke ihe nile I nyere n’iwu ga-atokwa m uto nke

uku, Bu nke m huworo n’anya.

Amaokwu 77: Ka obi ebere Gi nile biakute m, ka m we di ndu;

N’ihi na iwu Gi bu ihe na-ato m uto nke uku.

Amaokwu 97: Le ka m si hu iwu Gi n’anya! Ogologo ubochi nile ka

nke ahu bu ihe m na-atughari n’uche.

Udi okwu ndi a bu nke a puru ihu n’ime akuku nile na

Baibul. Onye o bula a zoputarala n’ezie ga na-enwe agu nakwa

mkpali ndi a n’ime ndu ya. Ya mere, o ga-achoputa ma mara

eziokwu a kowara na 1 Jon 2:3 ruo 5, bu ebe anyi na-aguta:

N’ime nke a ka anyi makwara na anyi amawo Ya, ma o buru na

anyi edebe ihe nile O nyere n’iwu. Onye na-asi, Amawo m Ya, ma o

dighi edebe ihe nile O nyere, o bu onye ugha, eziokwu adighikwa

n’ime onye ahu: ma onye o bula nke na-edebe okwu Ya, o bu n’ime

onye ahu ka e meworo ka ihunanya Chineke zuo oke. N’ime nke a

ka anyi maara na anyi no n’ime Ya.

Onye kwere ekwe n’ezie maara na iwu nke Chineke gunyere

ihe nile di na Baibul. O makwara udi oke nwute o na-enwe n’obi

mgbe o bula o ga-ekwe ka ochicho na-ezighi ezi nke anu ahu ya me

ya ka o mehie. Ya onwe ya ga-adi nnoo ka onye nke Chineke ahu, bu

Devid, bu onye dabara na nmehie jogburu onwe ya. Devid kwa, site

n’ike nke Muo Nso, dere gbasara nwute sitere n’ala obi ya, nke anyi

na-aguta gbasara ya n’Abu Oma 51.

Egwu na ima Jijiji

Otu ihe njirimara nke omume onye ahu a zoputagoro n’ezie

bu na o ghotara na Chineke di nso ma buru Onye ziri ezi, nakwa na

51
Chineke bu onye ikpe ziri ezi nke uwa nile. Na Ndi Filipai 2:12,

Chineke na-ekwuputa:

. . . Werenu egwu na ima jijiji ruputa karia nzoputa nke onwe unu

nke uku.

Nzoputa nke onye kwere ekwe “ga-aruputa” n’ime ndu ya

bu nzoputa nke Chineke nyegoro ya. Mana dika o na-etolite n’amara

(II Pita 3:18), ya bu, dika o na-ebiwanye ndu n’uzo na-enye Chineke

otuto nakwa puo n’igbaso ochicho nke ihe ndi bu nmehie nke anu

ahu ya a na-azoputaghi azoputa, o ga-eji egwu na ima jijiji me nke a.

Mmadu inogide n’ima jijiji nakwa na-atu egwu n’ihu

Chineke nwere ike idicha ka ihe na-adabaghi adaba nyere omaricha

nchekwa nke e nyerela onye ahu a zoputagoro.

Nke a bu okwu puru iju anyi anya n’ihi na anyi nwere ike naatu

anya na n’ihi na anyi enwela nzoputa, na a ga-ewepucha egwu

nile anyi nwere n’ebe Chineke no. Mmadu inogide n’ima jijiji nakwa

na-atu egwu n’ihu Chineke nwere ike idicha ka ihe na-adabaghi

adaba nyere omaricha nchekwa nke e nyerela onye ahu a

zoputagoro. Dika ima atu, o maara na Kraist akwuola ugwo maka

nmehie ya nile, o makwara na o nweghizi ka o noro n’onodu ibu

onye e bibiri.

Mana, anyi aghaghi icheta na, na Muo Nso bi n’ime onye ahu

a zoputara. Onye ahu kwerere ekwe n’ezie amalitekwala ihuwanye

ihe nile Baibul na-akuzi n’anya ma na-akwanyekwara ihe nile Baibul

na-akuzi ugwu. Ya mere, o na-amuta ma na-amatawanye na Chineke

di uku. O maara na Chineke bu Chineke ahu kachasi ihe nile elu bu

onye kwupuru okwu onu ma me ka mbara uwa nke mara nma di. O

maara na Chineke bu onye ikpe kachasi elu, Onye maazuru ihe nile

obuna nmehie nke dikarisiri nta n’ime mmadu nile. O maara na

Chineke ziri nnoo ezi n’ebe o di uku nke na obuna nmehie dikarisiri

nta ezuola ime ka onuma nke Chineke di n’ebe mmadu no. Onye

kwere ekwe n’ezie maara na ya onwe ya ka nwere nmehie

n’agbanyeghi na n’uzo putara nnukwu ihe ya onwe ya naerubewanyezi

isi n’iwu nile nke Chineke karia ka o sibu eme tutu a

zoputa ya. O makwara nke oma n’eziokwu na e wezuga ebere nakwa

amara nke Chineke, na o tosiri ka e bibie ya.

52
N’otu aka, n’ihi ihunanya nakwa ntukwasi obi miri emi o

nwere n’ebe Baibul di, onye ahu kwere ekwe n’ezie na-amatawanyezi

na o no na nchekwa ebighi ebi n’ime Kraist, o makwara na o gaghizi

ano n’onodu ibu onye e bibiri. O maara na nmehie ya nile aburula

nke Kraist kpuchitere. N’aka nke ozo, ka o na-amatawanyezi nkuzi

nke Baibul, mgbe ahu ka o ga na-aghotazi na o tosiri n’ezie ka oke

iwe nke Chineke dakwasi ya we buru ugwo maka nmehie ya nile. O

maara na o bu nani ebere nakwa amara nke Chineke butere ma o bu

wetere ya nzoputa ya. Ya mere, o na-ama jijiji n’egwu nakwa na

nrube isi n’ihu Chineke. O ghotara n’ezie na nzoputa nke o nwetere

erughiri ya inwete ya.

O bu ya mere Baibul ji ekwuputa na onye ahu a zoputagoro

n’ezie na-atu egwu nke Chineke, nke bu ihe anyi na-aguta dika ima

atu, n’amaokwu ndi a na-esote.

Abu Oma 34:9: Tuanu egwu Jehova, unu ndi nso Ya: N’ihi na o

dighi ihe na-ako ndi na-atu egwu Ya.

Abu Oma 112:1: Tonu Ja. Onye ihe na-agara nke oma ka nwoke ahu

bu nke na-atu egwu Jehova. Nke ihe nile O nyere n’iwu na-ato uto

nke uku.

Ilu 3:7: Abula onye maara ihe n’anya gi onwe gi; Tua egwu Jehova,

we si n’ihe ojo wezuga onwe gi.

Ukpuru nke a na-egosiputakwa eziokwu a nke bu na ndi ahu

na-adighi anu Okwu nke Chineke anaghi atu egwu nke Chineke.

Baibul na-ekwuputa nke a n’ime akuku Akwukwo Nso ndi a.

Jeremaia 44:9 ruo 10: Unu echezowo ihe ojo nile nke nna unu ha, na

ihe ojo nile nke ndi eze Juda, na ihe ojo nile nke ndinyom ha, na

ihe ojo nile unu, na ihe ojo nile nke ndinyom unu, nke ha mere

n’ala Juda, na n’ezi nile nke Jerusalem? A zopiaghi ha n’obi rue ta,

ha atughikwa egwu, ha ejegharighikwa n’iwu M, na n’ukpuru M

nile, nke M tinyere n’iru unu na n’iru nna unu ha.

Jeremaia 5:24 ruo 25: Ha asighikwa n’obi ha, Biko, ka anyi tua egwu

Jehova, bu Chineke anyi, Onye na-enye oke mmiri ozuzo, ma nke

mbu ma nke ikpeazu, na mgbe ya; izu nile a kara aka nke owuwe

ihe ubi ka O na-edebere anyi. Ajo omume nile unu ewezugawo ihe

ndi a, nmehie nile unu egbochiwokwara unu ezi ihe.

Aisaia 57:11 ruo 12: Ma onye ka i chegbuworo onwe gi banyere ya,

we tua egwu ya, na i na-ekwu okwu ugha, we ghara icheta m, ghara

kwa itinye ya n’obi gi? Mu onwe M adighi agba nkiti obuna site na

53
mgbe ebighi ebi gara aga, i we ghara itu egwu M? Mu onwe M gaegosi

ezi omume gi; ma olu gi nile, ha agaghi abara gi uru.

Eklisiastis 8:13: Ma o gaghi adiri onye na-emebi iwu nma, o gaghi

emekwa ka ubochi ya di ogologo, bu nke dika onyinyo; n’ihi na o

dighi atu egwu n’iru Chineke.

Mana Ihunanya Zuru Oke na-achupu Egwu

O bu eziokwu na Baibul na-akuzi na ihunanya zuru oke naachupu

egwu. Anyi na-aguta na I Jon 4:18:

Egwu adighi n’ihunanya: kama ihunanya nke zuru oke na-achupu

egwu n’ezi, n’ihi na egwu nwere ahuhu nmehie a ga-enye ya; ma

onye na-atu egwu, a ka emeghi ya ka o zuo oke n’ime ihunanya.

Anyi nwere ike kpebie na n’ihi na onye kwere ekwe n’ezie

enwetela ihunanya zuru oke nke Kraist, na o gaghizi atu egwu.

N’eziokwu, n’otu uzo, anyi puru ighota okwu a bu “egwu”

n’amaokwu a na o na-ekwu maka egwu nke mbibi ebighi ebi.

Ihunanya zuru oke nke Chineke nwere n’ebe onye kwere ekwe n’ezie

no na-ewepu egwu a. Nnukwu nkwa nke nzoputa bu nchekwa

ebighi ebi n’ime Kraist.

Mana, anyi ka kwesiriri ileba anya n’amaokwu nile ndi ahu

na-akuzi na njirimara onye kwere ekwe bu na o na-atu egwu Chineke

(Olu 9:31, 10:35, Ndi Filipai 2:12, I Pita 2:17, Ilu 1:7, Eklisiastis 8:12 ruo

13). Olee otu anyi ga-esizi ghota I Jon 4:18, nke na-akuzi na ihunanya

zuru oke na-achupu egwu? Aziza ya na-abia mgbe anyi ga-amuta otu

Baibul si akowa okwu a bu ihunanya. Na Jon 14:21 anyi na-aguta:

Onye nwere ihe M nyere n’iwu, nke na-edebekwa ha, o bu onye

ahu na-ahu M n’anya: onye na-ahu M n’anya, Nna M ga-ahukwa ya

n’anya, Mu onwe M ga-ahukwa ya n’anya, were onwe M gosi Ya.

Iwu Chineke nke a bu nke e kwuputakwara ozo na Jon 14:23,

ebe anyi na-aguta:

Jisus zara, si ya, O buru na mmadu ahu M n’anya, o ga-edebe okwu

M: Nna M ga-ahukwa ya n’anya, Anyi ga-abiakwutekwa ya, naemekwa

ebe obibi Anyi n’ebe o no.

Ya bu, ihunanya n’ozuzu ya bu ihe e ji mara nrube isi nyere

iwu nile nke Chineke, bu Baibul. Otu o masiri mmadu na-ekwuputa

54
na ya huru Kraist n’anya, ihe nwale ga-egosi n’ezie, ma o nwekwara

ihunanya bu nkwudosi ike ya, nrube isi ya nyere akwukwo iwu nke

Chineke, bu Baibul.

Ihunanya zuru oke kwesiri inwe nrube isi zuru oke

Mana nke ahu putara na ihunanya zuru oke kwesiri inwe

nrube isi zuru oke. Mana, nrube isi zuru oke, apughi ibia ma oli we

ruo na anyi anata ahu anyi di ohu a kpolitere n’onwu, a gaghikwa

enye anyi ha we ruo n’ubochi nke owuwe. Ka o di ugbu a, n’ime

nkpuru obi ohu anyi a kpolitere n’onwu, nke anyi natara n’oge ahu

anyi nwetere nzoputa, anyi bi n’ime ahu nke ka na-enwe agu naezighi

ezi ime nmehie. Ya mere, n’oge ugbu a, anyi enweghi

ihunanya zuru oke, ya mere apughi ibi ndu na-enweghi egwu n’ime

anyi.

N’oge gara aga n’ime omumu a anyi mutara otu ihe mere

anyi ji atu egwu Chineke ma na-ama jijiji n’ihu Chineke, mana o

kwesiri ka e kwukwuo ihe ozo gbasara nke ahu. Mgbe Devid, bu

onye Chineke bu n’obi, onye Chineke huru n’anya nke uku, mere

nmehie, Chineke gwara anyi banyere ihe sitere n’obi nwoke a puta

n’Abu Oma 51. Abu Oma a deturu ihe sitere n’obi Devid puta, mana

anyi ga-aguputa nani otu amaokwu, Abu oma 51:11. ebe anyi naaguta:

Atupula m n’iru Gi; Anarakwala m Muo Nso Gi.

Devid anatabuola ndu ebighi ebi. O norobuola na nchekwa

ebighi ebi n’ime alaeze nke Chineke. Oleezi otu o puru isi kwuo

okwu ndi nke Abu Oma a, nke Chineke Muo Nso nyere ya ka o

kwuo? Aziza ya na-abia mgbe anyi ga-achoputa nataramahuhu buru

oke ibu nke na-eso nmehie. Nmehie o bula tosiri inwe ugwo a gaakwuru

ya. Ya mere, mgbe onye kwere ekwe n’ezie na-emehie,

eziokwu abuo kwesiri ibami ya ime.

Onyenwe anyi Jisos Kraist kwuru ugwo maka nmehie nile anyi,

nke gunyere nmehie nile nke onye kwere ekwe n’ezie na-eme mgbe a

zoputachara ya.

Eziokwu nke mbu bu na Onyenwe anyi Jisos Kraist kwuru

ugwo maka nmehie nile anyi, nke gunyere nmehie nile nke onye ahu

55
kwere ekwe na-eme mgbe a zoputachara ya. Eenu, o bu eziokwu, na

Chineke maara site na mbido na onye ahu kwere ekwe n’ezie ga-eme

nmehie ndi a, ya mere, Chineke ebokwasilari ha Jisos, Jisos

kwukwara ugwo ha n’oge di anya gara aga. Mana nke ahu

agbanweghi eziokwu ahu doro anya nke bu na nmehie ndi a bu nke

onye na-eme ha bu onye ahu mutagoro udi oke njo nmehie di nakwa

ugwo buru oke ibu nke ikpe ziri ezi nke Chineke zuru oke choro. Ya

mere, onye ahu kwere ekwe n’ezie na-atu egwu ma na-ama jijiji mgbe

ahu o na-aghota na oge o bula o mere nmehie, nmehie nke a, kwa, bu

nke e bokwasikwara Onye nzoputa anyi di ngozi.

Eziokwu nke abuo bu na onye ahu kwere ekwe n’ezie naamatawanyezi

otu nmehie si buru ihe jogburu onwe ya nakwa ugwo

di oke njo nke ikpe ziri ezi zuru oke nke Chineke na-anata dika ugwo

maka nmehie. O makwara na oge o bula o mere nmehie, na o eme ihe

nke bu inupu isi megide Onye nzoputa ya o huru n’anya. N’otu aka,

o mara na nmehie ya ahu bu nke obara nke Jisos wusiri kpuchigoro

nakwa na a gaghi agu nke ahu megide ya. N’aka nke ozo, o maara na

mgbaghara nke nmehie ya bu nani n’ihi ebere nakwa amara nke

Chineke nke onye ahu na-etozughidi inwete ha ma oli. Ya mere, na o

nwadiri anwa ime nmehie na-eme ya ka o na-ebizi ndu ya n’egwu

nakwa ima jijiji n’ihu Chineke, nke ahu na-akpalikwa agu n’ime ya

ka o gharazie ime nmehie, kama, n’ezie, ka o na-ebiwanyezi ndu na

nrube isi n’ezie nyere iwu nile nke Chineke.

Ya mere, anyi na-aghota na onye ahu a zoputara ga na-ebizi

ndu n’uzo di nnukwu iche nakwa na-ahuta nmehie n’uzo di iche, ma

nwekwa omume di iche n’ebe Chineke no, nakwa n’ebe Baibul di,

nke dikwa iche na ndu nke onye a na-azoputaghi.

Olileanya O Dikwara M?

Ihe ndi nke anyi mutagoro o putara ba mmadu ibu onye a

zoputara bu nke olileanya na-adighi n’ime ya? Ee, o bu n’ezie nke

olileanya na-adighi n’ime ya ma o buru na anyi na-adabere n’uzo o

bula n’oru aka anyi, n’okwukwe anyi, n’ochicho obi anyi, ma o bu na

nrube isi anyi, iji tinye obuna utu dikarisiri nta n’inye anyi nzoputa.

Nke a bu n’ihi na anyi onwe anyi iche na anyi puru itinye utu o bula

na nzoputa anyi bu ihe akaebe na-egosi na anyi ji mpako eleda ihe

nile Baibul na-akuzi anya bu ihe gbasara ihe nile di itunanya ma ma

oke nma nke Chineke mebere. O putara na anyi na-atukwasi obi

n’atumatu nzoputa nke na-apughi izoputa onye o bula, n’ezie nke

ahu na-ahutakwa atumatu nzoputa nke Chineke zuru oke n’udi na o

bu ihe nzuzu.

56
Anyi na-ebi ndu n’ubochi a bu mgbe Chineke na-azoputa

oke igwe ndi mmadu, nke onye o bula na-apughi iguta onu.

Mana mgbe anyi ga-aghota atumatu nzoputa nke Chineke,

mgbe anyi ga-aghota na O bu Ya bu nani onye puru iru oru nile a

choro maka nzoputa anyi, mgbe ahu anyi puru inwezi olileanya,

olileanya zuru ezu. Anyi na-ebi ndu n’ubochi a bu mgbe Chineke naazoputa

oke igwe ndi mmadu, nke onye o bula na-apughi iguta onu.

(Nkpughe 7:9). Ozokwa, Baibul na-ekwuputa na Chineke ahoputala

ufodu ndi mmadu ma were ha nye Kraist, nakwa na Kraist akwuola

ugwo maka nmehie nile nke ha, nke ahu na-enyekwa ndi a naazoputaghi

nnukwu olileanya.

Onye o bula a na-azoputaghi nke nwere agu miri emi ibu

onye a zoputara, ma ghota na o puru ibu onye a zoputara nani n’otu

Chineke si cho ya, onye ahu nwere ike buru otu n’ime ndi Chineke

hoputara ma o bu ndi O hotara. Ebe o bu na atumatu nhoputa nke

Chineke enweghi ihe o bula jikoro ya na udi ezi mmadu anyi bu

(anyi abughi ezi mmadu), n’agbanyeghikwa udi uku nakwa udi njo

nmehie mmadu digoro, onye ahu puru ibu otu n’ime ndi Chineke

hoputara dika onye o bula ozo a zoputagoro. N’eziokwu, atumatu

nhoputa nke Chineke na-enye onye ahu a na-azoputaghi nnukwu

agbamume bu onye na-eji obi ya acho ka ya onwe ya, kwa buru onye

a zoputara.

E nwere o pekata mpe ya buru eziokwu asaa nke e kpughere

n’ime Baibul nke kwesiri ibu oke ihe agbamume nyere onye ahu o bu

n’ezie na ochicho obi ya bu na nmehie ya nile ga-abu nke obara Jisos

kpuchitere. Anyi arutubuola aka n’ufodu eziokwu ndi a. Mana, ha di

oke mkpa nke na anyi ga-eji nkenke oge guputa ha ozo. Ha bu ndi a

na-esote.

1. N’oge ugbu a, o bu ubochi nke nzoputa. Anyi amutala na

Chineke anaghizi azoputa ndi mmadu site n’iji oru nke nzuko uka,

ndi ndu ha, ma o bu ndi nke ha. Mana, nkuzi Baibul nke putara

nnukwu ihe bu na n’eziokwu taa, Chineke na-ewebata oke owuwe

ihe ubi nke bu ndi mmadu n’ime alaeze nke Chineke. N’agbanyeghi

na eziokwu nke a abughi isiokwu e ji maka ya dee akwukwo a, mana

anyi puru iguputa amaokwu ole na ole ndi na-agwa anyi n’ezie na

nke a na-eme.

Na Joel 2:24 anyi na-aguta:

57
Ebe nzocha oka nile ga-ejuputakwa n’oka wheat, ebe inara

mmanya vine na mmanu ga-erubiga kwa na mmanya vine ohu na

mmanu ohu [nzoputa].

Baibul na-ekwukwa na Nkpughe 7:9:

Mgbe ihe ndi a gasiri m we hu, ma le, oke igwe mmadu, nke onye o

bula na-apughi iguta onu, ndi si na mba nile o bula, na ebo nile, na

ndi nile, na asusu nile, puta, na-eguzo n’iru oche eze ahu na n’iru

Nwa aturu ahu, e gbokwasiworo ha uwe nwuda di ocha, igu nkwu

dika n’aka ha;

Nkpughe 7:13 ruo 14 na-agwakwa anyi:

Otu n’etiti ndi okenye ahu we za, si m, Ndi a ndi e gbokwasiworo

uwe nwuda ahu di ocha, ha bu ole ndi, olee ebe ha si bia kwa? M

we si ya, Onyenwe m, gi onwe gi matara. O we si m, Ndi a bu ndi

na-esi n’oke nkpagbu ahu puta, ha sakwara uwe nwuda ha, me kwa

ka ha di oche n’ime obara Nwa aturu ahu.

Na Habakuk 2:14 anyi na-aguta:

N’ihi na uwa ga-ejuputa n’omuma ebube Jehova, dika mmiri si

ekpuchi oke osimiri.

Na Jeremaia 33:22 anyi na-agu:

Otu a gaghi agu usu ihe di n’eluigwe onu, na otu a gaghi atuta aja

nke oke osimiri; otu a ka M ga-eme ka nkpuru Devid, bu oru M, na

ndi Livai ndi na-ejere M ozi, ba uba.

Amaokwu ndi a dika otutu ndi ozokwa na-enye onye o bula

a na-azoputaghi nnukwu olileanya bu onye na-eji obi umeala

agakwuru Chineke ma na-etiku Ya maka ebere.

Ya mere, anyi ga-amata n’ezie na oke igwe ndi mmadu ka a

na-azoputa taa. Onye o bula a na-azoputaghi nwere ike ibu otu onye

n’ime oke igwe mmadu ahu. Leenu ka o si buru nnukwu ngozi imata

na anyi na-ebi ndu n’oge a bu mgbe o bu na, n’ebe nile n’uwa gba

gburugburu, otutu ndi mmadu ka a na-azoputa.

2. Ebe ma o gburugburu ebe Chineke na-azoputa mmadu

n’ime ya bu inu Okwu nke Chineke, bu Baibul. Baibul na-ekwuputa

na Ndi Rom 10:17:

58
Ya mere, okwukwe si n’onunu puta, ma onunu ahu sitere n’okwu

Kraist.

N’ubochi taa, karia n’oge o bula ozo gaburu aga kemgbe uwa

dibara, pasent onu ogu ndi mmadu hiri nne bu ndi guru akwukwo,

Baibul dikwa nyere ha n’asusu nke ha na-asu. O bu nnoo oke ihe

agbamume na onye o bula puru itinye onwe ya nakwa ndi ezinulo ya

a zoputara nakwa ndi a na-azoputaghi n’ebe ha ga na-anu okwu ndi

sitere na Baibul. O puru ime nke a site na ya onwe ya igu Baibul.

N’oge ufodu, o puru ige nti ka a na-agu Baibul ma na-akuzi ya na

mgbasa ozi nke redio dika nke Faimly Radio. N’eziokwu, ebe

Chineke na-ano azoputa ndi mmadu di uku karia ma buru nke

olileanya di na ya karia n’oge o bula ozo kemgbe uwa dibara. Ya

mere, anyi onwe anyi bu ndi nne na nna ga na-acho ka umu ohuru

anyi nakwa umu anyi na-ano n’onodu inu Okwu nke Chineke. O

bukwa ya bu otu ihe mere redio jiri buru ngwa oru bara uru ma di

mkpa n’ebe o di ukwu nke a puru iji ime ka Ozioma bata n’obodo

anyi nile ma rute ndi mmadu no n’ebe nile n’uwa gba gburugburu.

3. Kraist biara izoputa ndi nmehie. Kraist abiaghi izoputa ndi

ahu na-ahuta onwe ha ka ndi ziri ezi n’omume, ndi na-ahuta onwe

ha ka ndi bu ezigbo mmadu, na-eme omume ziri ezi bu ndi nwere

ntukwasi obi na omume ha ziri ezi bu ihe nke ga-akpali Chineke ka O

we mete ha nke oma. Kraist biara izoputa ndi nmehie!

O bu nnoo ihe agbamume iguta banyere ekperima ahu

a kpogidere ya na Jisos n’obe.

O bu nnoo ihe agbamume iguta banyere ekperima ahu a

kpogidere ya na Jisos n’obe. Na mbu, ekperima nke a gosiri nleda

anya nyere Jisos. Anyi na-aguta na Matiu 27:41 ruo 44:

Otu ahu ka ndi isi nchu aja na-ekwu kwa, ebe ha na ndi ode

akwukwo na ndi okenye na-eme Ya ihe ochi, si, O zoputara ndi

ozo; O pughi izoputa Onwe Ya. O bu Eze Israel; ka O si n’elu obe

ridata ugbu a, anyi ga-ekwekwa na Ya. O na-atukwasi obi Ya na

Chineke; ka O doputa Ya ugbu a, o buru na O na-acho Ya: n’ihi na

O siri, Abu M Okpara Chineke. Ndi ahu na-apunara mmadu ihe,

ndi a kpogidere Ya na ha n’obi, na-atakwa Ya uta otu aka ahu.

59
N’agbanyeghi ya, o bu ihe di oke ebube, na nani na nkeji

minit ma o bu hour ole na ole tutu ekperima a kpogidere n’obe

anwuo, o rioro Jisos aririo ebere, o natakwara aziza nke mere ka ya

onwe ya nakwa anyi onwe anyi maara n’ezie na n’oge nke ahu a naatughi

anya nakwa n’ebe nke a na-atughi anya ya, o burula onye a

zoputara. Anyi na-aguta na Luk 23:39 ruo 43:

Otu n’ime ndi ahu na-aru oru ojo ndi a kwubara na-ekwulukwa Ya,

si, Gi onwe Gi abughi Kraist ahu? zoputa Onwe Gi na anyi. Ma ibe

ya zara, we bara ya nba, si, Gi onwe gi adighi atu egwu obuna

Chineke, ebe i no n’omuma ikpe ahu? N’eziokwu a makwara anyi

ikpe ziri ezi; n’ihi na anyi na-anata ihe kwesiri ihe anyi mere: ma o

dighi ihe o bula Onye a mehiere. O we si, Jisus, cheta m mgbe o

bula I ga-abia n’alaeze Gi. O we si ya, N’ezie asi M i, Taa ka Mu na

gi ga-ano na Paradais.

Onye nmehie a obi joro njo nke ukwu no na-anu Okwu nke

Chineke n’ihi na o nuru ka Jisos gwara Meri okwu, nakwa onye ozi

Jon, ma gwakwa Chineke n’onwe Ya okwu. N’ebe ahu, kwa, onye

nmehie a obi joro oke njo ka e nyeziri ndu ebighi ebi. N’ihi nke a,

onye o bula ka bu onye a na-azoputaghi, n’agbanyeghi udi uku

nmehie ya nwere ike idi, o puru ima na Jisos biara maka ndi nmehie.

Nke a bu nnoo ihe agbamume magburu onwe ya!

4. Jisos abughi onye na-ele mmadu anya n’ihu. Nke a putara

na o nweghi otu ndi mmadu o bula a ga-asi na ha nwekari ike ibu ndi

a zoputara karia otu ndi mmadu nke ozo. Otu onye nwere ike oha

obodo ana-ezere ya, e nwere ike na-ahuta ya dika “onye a juru aju”

n’ebe ndi mmadu ibe ya no, mana n’ime Baibul Chineke na-agwa

anyi banyere ndi mmadu bu ndi a zoputara bukwa ndi nzuko naeleda

anya ma kpo asi n’ubochi nke Jisos. Ihe atu gbasara nke a bu

nzoputa nke nwanyi Sameria ahu (Jon 4:4 ruo 42), onye ona utu ahu

bu Zakios (Luk 19:2 ruo 8), onye ekpenta (Luk 17:12 ruo 19),

ekperima ahu bu onye e gburu maka mpu nile o mere (Luk 23:39 ruo

43), nakwa nwanyi ahu e jidere n’ikwa iko (Jon 8:1 ruo11). Ndi

mmadu nile a bucha ndi a na-ahuta dika ndi oha obodo juru aju,

mana Chineke zoputara nke o bula n’ime ha. N’ihi nke a, anyi na-ahu

n’uzo doro anya na O bughi onye na-ele mmadu anya n’ihu. O bu

nnoo ihe magburu onwe ya nyere onye ahu a na-azoputaghi.

5. Chineke di obi ebere. O bu eziokwu na ebere bu ihe a naagaghizi

ahu n’ime nzuko di iche iche bu ebe ndi ozuzu aturu ha, ndi

okenye ha, ndi dikon, nakwa ndi nkuzi Baibul na-ezi ndi ogbenye a

60
ozioma. O bukwa eziokwu na-ewute nke ukwu! N’ebe ndi na-abughi

n’ime nzuko, n’ebe nile n’uwa, Chineke na-aga n’ihu na-egosiputa

ebere Ya nke kariri nghota. Chineke bu Chineke obi ebere.

Anyi na-aguta n’Abu Oma 103:8

Jehova nwere obi ebere, na-emekwa amara, O dighi ewe iwe ososo,

O na-abakwa uba n’ebere.

Nakwa n’Abu Akwa 3:31 ruo 32, anyi na-aguta:

N’ihi na Onyenwe anyi agaghi aju rue mgbe ebighi ebi. N’ihi na o

buru na O mekpa ahu, ma O ga-enwe obi ebere dika iba uba nke

ebere Ya nile si di.

Chineke na-ekwuputakwa n’uzo magburu onwe ya ma naegosi

omiiko na Joel 2:13:

Dowakwanu obi unu, adowakwala uwe unu, chigharikute Jehova,

bu Chineke unu: n’ihi na Onye amara na Onye obi ebere ka O bu,

Onye na-adighi ewe iwe ososo, Nke na-abakwa uba n’ebere, O naecheghari

kwa uche banyere ihe ojo ahu O ga-ewete.

6. Anyi n’onwe anyi puru ime ka Chineke mara na anyi

nwere agu miri emi ibu ndi a zoputara. Anyi puru irio aririo, tikuo

ma kpokuo Chineke maka inwete nzoputa. Ikpegara Chineke ekpere

bu oru nke anyi na-aru aru, ya mere anyi maara na ikpegara Chineke

ekpere agaghi abu ihe na-ewete nzoputa ma o bu tinye utu n’inye

anyi nzoputa. Mana anyi puru imata na dika anyi na-ebesara

Chineke akwa, O ga-amara banyere ochicho obi anyi ibu ndi a

zoputara.

Jisos na-enye anyi ihe nlereanya gbasara onye ona utu bu

onye kpere ekpere maka ebere nke Chineke, nke anyi na-aguta na

Luk 18:13 ruo 14:

Ma onye ona utu ahu guzoro n’ebe di anya, o choghikwa iweli

obuna anya ya lee eluigwe, kama o na-eti aka n’obi ya, si, Chineke,

ka obi Gi juru n’ebe mu, bu onye nmehie no. Asi M unu, Nwoke a

ridara n’ulo ya buru onye a guworo n’onye ezi omume kari ibe ya:

n’ihi na onye o bula nke na-eweli onwe ya elu, a ga-eweda ya, ma

onye na-eweda onwe ya, a ga-eweli ya elu.

61
7. Anyi ekwesighi ka olileanya anyi nwere maka inwete

nzoputa funari anyi. O buru na Chineke na-ezube izoputa anyi, O gaeme

nke a n’oge nke Ya. O nwere ike izoputa anyi n’oge anyi ka

malitesiri ndu anyi ma o bu nzoputa nwere ike ibia na hour ole na ole

tutu anyi anwuo. Anyi agaghi anwa anwa gwa Chineke oge nke O

ga-enyeriri anyi nzoputa, ma o buru, n’ezie, na o bu ebumnuche

Chineke izoputa anyi.

O buru na Chineke na-ezube izoputa anyi. O ga-eme nke a n’oge nke Ya.

Anyi na-aguta n’Abu Akwa 3:26:

O di nma ka mmadu chere nzoputa Jehova, derekwa du n’ichere ya.

Chineke na-enyekwa anyi okwu nkasi obi di ukwu n’Abu

Oma 62:5 ruo 8, ebe anyi na-aguta:

Na-edere nani Chineke du, nkpuru obi m; N’ihi na o bu Ya ka

olileanya m si puta. Nani Ya onwe Ya bu oke nkume m na nzoputa

m; O bu ulo elu m; a gaghi ewezuga m n’onodu m. N’ebe Chineke

no ka nzoputa m na nsopuru m di: Oke nkume nke ike m, bu ebe

ngbaba m, di n’ime Chineke. Tukwasinu Ya obi na mgbe nile, unu

ndi Ya; Wusinu obi unu n’iru Ya dika mmiri: Chineke buru anyi

ebe ngbaba.

Ka mmadu na-ewere ndidi na-echere Jehova, o nwere ike oke

nchekasi abata ya n’ime. Mmadu iburu onye a zoputara bu okwu di

oke mkpa. Mmadu ibugide onye a na-azoputaghi jogburu onwe ya.

O bu ihe magburu onwe ya, na Chineke na-enyekwa nnukwu

nkasi obi ahu na nkwa nke e kwere na Ndi Filipai 4:6:

Unu echegbula onwe unu n’ihe o bula; kama n’ihe nile o bula site

n’ekpere na aririo, ya na ekele, menu ka Chineke mara ihe nile unu

na-ario.

Chineke we nyekwa anyi okwu agbamume na Ndi Filipai 4:7:

Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, ga-echekwa obi unu na

echiche uche unu nche n’ime Kraist Jisus.

62
Ya mere, Chineke na-akasi anyi obi site n’igba anyi ume ka

anyi dabere kpamkpam na Ya. O na-agba anyi ume ka anyi gwa Ya

ihe nile banyere nchekasi anyi. O bu ihe mara oke nma na, O bu

Onye na-eguzogide n’ihe ma burukwa Onye kwesiri ntukwasi obi

imezu uche Ya zuru oke. Anyi ga-adabere n’aka Ya puru ime ihe nile.

Ka o di ugbu a, anyi puru inu ihe Chineke na-ekwu dika anyi

na-aga n’ihu lezie anya nke oma ma jiri ikpe ekpere na-agu Baibul.

Mgbe o bula kwa nchekasi ga-abia, ugboro ugboro anyi puru iji

nkwuwa okwu we ga n’oche eze amara nke Chineke we gwa

Chineke ihe nile banyere ya. Leenu ka Chineke si di obi ebere!

Chineke na-enye ndi a na-azoputaghi nnukwu okwu

agbamume na Zefanaia 2:3, ebe anyi na-aguta:

Chonu Jehova, unu nile ndi di umeala n’obi bi n’uwa, ndi luworo

ihe O kpere n’ikpe; chonu ezi omume, chonu umeala n’obi: eleghi

anya a ga-ezobe unu n’ubochi iwe Jehova.

Ya mere, eleghi anya Chineke ga-azoputa gi.

63
INDEKS NKE AKWUKWO NSO

Jenesis 9:6, 18

Jenesis 15:6, 37, 39, 40

Jenesis 22, 20

pụpụ 31:13-14, 20

nụ ọgụgụ 15, 38, 44, 47

nụ ọgụgụ 15:32-36, 21

nụ ọgụgụ 22:12-13, 17, 23

nụ ọgụgụ Isi nke

22 na 23, 18

Deuterọnọmi 4:29, 28

Deuterọnọmi 28:1, 28:15,

30:6-16, 24

Deuterọnọmi 30:6, 36

I Samuel 10:9-12, 17, 23

I Ịhe Emere 10:13, 23

Abụ ọma 34:9, 53

Abụ ọma 51, 51, 55

Abụ ọma 51:11, 55

Abụ ọma 62:5-8, 62

Abụ ọma 103:8, 61

Abụ ọma 112:1, 53

Abụ ọma 119, 50

Abụ ọma 119:10, 51

Abụ ọma 119:11, 51

Abụ ọma 119: 16, 51

Abụ ọma 119:24, 51

Abụ ọma 119:47, 51

Abụ ọma 119:77, 51

Abụ ọma 119:97, 51

Abụ ọma 138:2, 3

Abụ ọma 139:23-24, 23

Ilu 1:7, 54

Ilu 3:7, 53

Eklisiastis 8:12-13, 54

Eklisiastis 8:13, 54

Aịsaịa 53:6, 6

Aịsaịa 57:11-12, 53

Aịsaịa 63:5, 6

Aịsaịa 66:24, 18

Jeremaịa 5:24-25, 53

Jeremaịa 17:9, 28, 32

Jeremaịa 23:39-40, 24:10, 18

Jeremaịa 29:11-13, 28

Jeremaịa 29:17-19, 26

Jeremaịa 29:18-19, 27

Jeremaịa 31:8-9, 25

Jeremaịa 33:22, 58

Jeremaịa 36:1-4, 3

Jeremaịa 44:9-10, 53

A bụ A kwa 3:26, 62

A bụ A kwa 3:31-32, 61

Ezikiel 22:30, 6

Ezikiel 33:11, 18

Ezikiel 36:24-27, 32

Ezikiel 36:25-27, 29

Ezikiel 36:26, 11, 33

Ezikiel 37, 11, 35

Ezikiel 37:1-2, 10

Ezikiel 37:1-14, 16

Joel 2:12-14, 25

Joel 2:13, 61

Joel 2:13-14, 42

Joel 2:24, 57

Jona 3, 42

Jona 3:5, 36

64
Jona 3:8-10, 42

Jona 3:9, 24, 27

Jona 3:10, 14

Habakuk 2:14, 58

Zefanaịa 2:3, 42, 63

Matiu 4:14, 8:17, 12:17, 41

Matiu 5:22, 18

Matiu 7:22, 15

Matiu 9:16, 10

Matiu 9:17, 10

Matiu 15:19, 9, 32

Matiu 23, 27

Matiu 27:41-44, 59

Matiu 27:46, 7

Mak 4:33-34, 46

Mak 7:21, 28

Mak 13:13, 30

Luk 13:24, 19

Luk 17:12-19, 60

Luk 18:13, 25

Luk 18:13-14, 61

Luk 19:2-8, 60

Luk 19:41, 18

Luk 23:9-43, 5

Luk 23:39-43, 60

Jọn 3:3, 13

Jọn 3:3 na 7, 10

Jọn 3:5, 13

Jọn 3:16, 34

Jọn 4:4-42, 60

Jọn 4:10-15, 13

Jọn 6:37, 5

Jọn 6:44, 17, 18

Jọn 7:38, 13

Jọn 8, 5

Jọn 8:1-11, 60

Jọn 8:9, 17, 23

Jọn 8:44, 45

Jọn 11, 11

Jọn 11:39, 10, 16, 33

Jọn 14:21, 54

Jọn 14:23, 10, 54

lụ Ndị ozi 8:13-23, 32

lụ Ndị ozi 9:31, 10:35, 54

lụ Ndị ozi 16:31, 33

Ndị Rom 2:11, 5

Ndị Rom 2:13-15, 1

Ndị Rom 2:14-15, 17, 23

Ndị Rom 2:15, 18

Ndị Rom 3. 33

Ndị Rom 3:10-12, 4, 16

Ndị Rom 4:3, 37, 40

Ndị Rom 4:9, 37

Ndị Rom 4:11, 35, 36

Ndị Rom 7:21-24, 49

Ndị Rom 8:9, 50

Ndị Rom 8:35-39, 49

Ndị Rom 9:15, 5

Ndị Rom 9:31-32, 24

Ndị Rom 10:9-10, 32

Ndị Rom 10:13, 28, 29

Ndị Rom 10:17, 13, 26, 58

I Ndị Kọrịnt 2:13, 27

I Ndị Kọrịnt 15, 30

I Ndị Kọrịnt 15:52, 11

II Ndị Kọrịnt 2:4, 42, 43

II Ndị Kọrịnt 5:8, 12

II Ndị Kọrịnt 5:17, 10

II Ndị Kọrịnt 11:7, 42, 43

II Ndị Kọrịnt 11:13-15, 44

II Ndị Kọrịnt 11:14, 45

II Ndị Kọrịnt 11:15, 45

II Ndị Kọrịnt 13:5, 22

Ndị Galetia 2 34

Ndị Galetia 2:16, 14, 35, 41, 42, 43

65
Ndị Galetia 3, 34

Ndị Galetia 3:2, 34, 35

Ndị Galetia 3:6, 37, 40

Ndị Galetia 3:11, 35

Ndị Galetia 3:13, 7

Ndị Galetia 3:16, 49

Ndị Efesọs 1:3-5, 4

Ndị Efesọs 1:4, 5

Ndị Efesọs 1:13, 36

Ndị Efesọs 2:1-3, 12

Ndị Efesọs 2:3, 9

Ndị Efesọs 2:8, 35

Ndị Efesọs 2:8-9, 14

Ndị Efesọs 6:9, 5

I Jọn 4:18, 54

Nkpughe 7:9, 57, 58

Nkpughe 7:13-14, 58

Nkpughe 13:8, 8, 16

Nkpughe 19:11, 34, 43

Nkpughe 20:14-15, 9

Ndị Filipaị 2:12, 52, 54

Ndị Filipaị 3:20, 50

Ndị Filipaị 4:6, 62

Ndị Filipaị 4:7, 62

Ndị Kọlọsị 1:12-13, 50

Ndị Kọlọsị 3:25, 5

I Ndị Tesalonaịka 1:3, 15, 38

I Ndị Tesalonaịka 4, 12

II Ndị Tesalonaịka 1:11, 15, 38

Ndị Hibru 4:11, 19

Jemes 2:23, 40

I Pita 1:5, 30

I Pita 1:23, 10

I Pita 2:17, 54

II Pita 1:21, 3

II Pita 2:15-16, 23

II Pita 3:18, 50, 52

I Jọn 2:3-5, 51

I Jọn 2:3-6, 22

I Jọn 3:9, 48

66